Gaa n'Isiokwu

E Bukọtala Ụfọdụ Alaka Ụlọ Ọrụ Ndịàmà Jehova Ọnụ

E Bukọtala Ụfọdụ Alaka Ụlọ Ọrụ Ndịàmà Jehova Ọnụ

Malite mgbe e bidoro ibukọta alaka ụlọ ọrụ dị iche iche ruo n’ọnwa Septemba afọ 2012, e mechiela ihe karịrị alaka ụlọ ọrụ iri abụọ, gwazie ụfọdụ ndị na-eje ozi ebe ndị ahụ ka ha gafee n’alaka ụlọ ọrụ ndị ka buo ibu.

Ma, anyị enweela alaka ụlọ ọrụ n’obodo Sebia na Masedonia. E nwere ihe abụọ mere e ji na-ebukọta ụfọdụ alaka ụlọ ọrụ ọnụ.

1. Nkà na ụzụ emeela ka ọrụ dị mfe

Ígwè ọrụ ndị bụ́ ọkpọka a na-eji ezipụ ozi nakwa ndị nke e ji ebi akwụkwọ emeela ka ọrụ ọtụtụ ndị na-arụbu n’ụfọdụ alaka ụlọ ọrụ buru ibu bụrụzie ọrụ mmadụ ole na ole ga-arụli. O meela ka ndị na-arụ n’ebe ndị ahụ belata, ụfọdụ ndị na-arụbu n’obere alaka ụlọ ọrụ enwezie ebe ha ga-ebi ma ezite ha ná ndị nke ahụ buru ibu.

Ihe a emeekwala ka e nwekwuo ụmụnna ndị nọ n’alaka ụlọ ọrụ ndị buru ibu na-elekọta ọrụ ikwusa ozi ọma a na-arụ n’obodo ndị ha na-elekọta. Dị ka ihe atụ, e mechiela alaka ụlọ ọrụ anyị ndị dị na Kọsta Rika, El Salvadọ, Gụatemala, Họnduras, Nikaragụa na Panama. Ọ bụzi alaka ụlọ ọrụ anyị dị na Meksiko na-ahụ maka ọrụ ikwusa ozi ọma a na-arụ n’obodo ndị ahụ.

A gwaziri mmadụ iri anọ so ná ndị na-arụbu n’alaka ụlọ ọrụ ndị ahụ e mechiri emechi ka ha gaa rụwa n’alaka ụlọ ọrụ Meksiko. Ma, ihe dị ka mmadụ iri itoolu na ise n’ime ndị na-arụbu n’alaka ụlọ ọrụ ndị ahụ e mechiri emechi nọ n’obodo ha na-eje ozi oge niile.

Ndị nsụgharị nọbu n’alaka ụlọ ọrụ ndị ahụ e mechiri emechi ka nọkwa n’obodo ndị ahụ na-arụ ọrụ ha. Ma, ọ bụ alaka ụlọ ọrụ anyị dị na Meksiko na-elekọta ọrụ ha. Dị ka ihe atụ, ihe dị ka Ndịàmà Jehova iri abụọ na Panama na-asụgharị akwụkwọ anyị ndị e ji amụ Baịbụl n’asụsụ ndị a na-asụ n’obodo ahụ. Na Gụatemala, e nwere ndị nsụgharị iri na isii na-asụgharị akwụkwọ anyị ndị e ji amụ Baịbụl n’asụsụ anọ a na-asụ n’obodo ahụ. Tupu e mechie alaka ụlọ ọrụ isii ahụ, e nwere narị mmadụ atọ bụ́ ndị ozi Betel n’obodo ndị ahụ. Ma ugbu a e mechirila ha, ọ bụzi ihe dị ka mmadụ iri asaa na ise na-eje ozi bụ ndị Betel n’obodo ndị ahụ.

2. E nwekwuola ndị ozi oge niile na-ekwusa ozi ọma

N’ihi otú a e si bukọta ụfọdụ alaka ụlọ ọrụ, ọtụtụ Ndịàmà Jehova na-ejebu ozi n’alaka ụlọ ọrụ ndị ahụ e mechiri emechi e nwekwuola ohere ha ga-eji na-ekwusa ozi ọma.

Mgbe e mere ụdị ihe a n’Afrịka, e nwere otu Onyeàmà Jehova na-ejebu ozi na Betel e zipụrụ ka ọ gaa kwusawa ozi ọma. O kwuru na n’ime ọnwa ole na ole e zipụchara ya, na o sitụụrụ ya ike ime ka ebe ahụ e zigara ya mara ya ahụ́. Ma, o kwukwara na ozi ya na-aga kwa ụbọchị na-eme ya obi ụtọ, nakwa na Jehova na-agọzi ozi ya karịa otú ọ tụrụ anya ya. Ọ sị na ya na-akụziri mmadụ iri abụọ Baịbụl ugbu a, nakwa na ụfọdụ n’ime ha amalitela ịbịa ọmụmụ ihe.