Gaa n'Isiokwu

Ụmụ Nwaanyị Ndịàmà Jehova Hà Na-ekwusa Ozi Ọma?

Ụmụ Nwaanyị Ndịàmà Jehova Hà Na-ekwusa Ozi Ọma?

 Ee. Ndịàmà Jehova niile na-ekwusa ozi ọma, ọtụtụ n’ime ha bụkwa ụmụ nwaanyị. Baịbụl buru amụma na “ndị inyom na-ezisa ozi ọma bụ ìgwè dị ukwuu.”​—Abụ Ọma 68:11.

 Ụmụ nwaanyị Ndịàmà Jehova na-eme ihe ụmụ nwaanyị ụfọdụ a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl mere. (Ilu 31:10-​31) Ọ bụ eziokwu na ha anaghị abụ ndị ndú n’ọgbakọ, ha na-ekwusasi ozi ọma ike. Ha na-akụzikwara ụmụ ha ihe ndị Baịbụl kwuru. (Ilu 1:8) Ụmụ nwaanyị Ndịàmà Jehova na-agbalị ka ha jiri àgwà ọma ha na ihe ndị dị mma ha na-ekwu kụziere ndị ọzọ ihe.​—Taịtọs 2:​3-5.