Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova Ole Ka E Nwere n’Ụwa Niile?

Ndịàmà Jehova Ole Ka E Nwere n’Ụwa Niile?

Akụkọ Afọ Ije Ozi a 2023

Ndịàmà Jehova ole nọ́ n’ụwa niile

8,816,562

Ọgbakọ ole ha nwere

118,177

Obodo ole ha na-ekwusa ozi ọma na ha

239

Ngụkọta Ọnụ Ọgụgụ Niile E Nwere n’Afọ 2023

Akụkọ Ozi Mba Dị Iche Iche nke Afọ 2023

Olee otú unu si amata ole unu dị?

 Ndị anyị na-agụnye ná Ndịàmà Jehova bụ naanị ndị na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke kwa ọnwa. (Matiu 24:14) Ha bụ ma ndị e merela baptizim ha abụrụ Ndịàmà Jehova ma ndị a na-emebeghị baptizim ma ha ruru eru ikwusa ozi ọma.

Mmadụ ọ̀ ga-enye unu ego tupu ya aghọọ onye òtù unu?

 Mba. O nweghị ihe jikọrọ onyinye mmadụ nyere na ịgụnye onye ahụ n’Onyeàmà Jehova. O nweghịkwa ihe jikọrọ ya na ọrụ onye ahụ na-arụ ma ọ bụ ihe ùgwù onye ahụ nwere ná nzukọ anyị. (Ọrụ Ndịozi 8:​18-​20) Nke bụ́ eziokwu bụ na anyị anaghịdị ama ndị nyere onyinye. Onyeàmà Jehova ọ bụla na-eji oge ya, ike ya, na ihe ndị ọzọ o nwere akwado ọrụ anyị na-arụ n’ụwa niile otú o nwere ike nakwa otú ọ chọrọ.​—2 Ndị Kọrịnt 9:7.

Olee otú unu si amata mmadụ ole na-ekwusa ozi ọma kwa ọnwa?

 Kwa ọnwa, Onyeàmà Jehova ọ bụla na-ede awa ole o ji gaa ozi ọma ma nye ya ọgbakọ ọ nọ na ya. E nweghị onye a na-amanye ide nke ya.

 Ọgbakọ ọ bụla gbakọchaa nke ha, ha ezigara ya alaka ụlọ ọrụ anyị na-elekọta mba ha. Alaka ụlọ ọrụ ahụ ga-agbakọtazi nke ọgbakọ niile nọ́ n’obodo ahụ zigazie ya n’isi ụlọ ọrụ anyị.

 Afọ ije ozi nke ọ bụla gwụchaa, a na-amatazi Ndịàmà Jehova ole nọ́ n’obodo nke ọ bụla. A na-agbakọtazi ọnụ ọgụgụ ndị ahụ iji mata Ndịàmà Jehova ole e nwere n’ụwa niile. N’Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova, a na-ede akụkọ gbasara obodo nke ọ bụla na ihe ndị mere mgbe anyị na-ezi ozi ọma n’obodo ndị ahụ. Akụkọ ndị ahụ na-agba anyị ume otú ahụ ụdị akụkọ ahụ gbara Ndị Kraịst oge ochie ume.​—Ọrụ Ndịozi 2:​41; 4:4; 15:3.

Ùnu na-agụnye ndị so unu amụ ihe ma ha anaghị aga ozi ọma ná ndị òtù unu?

 Ọ bụ eziokwu na anyị anaghị agụnye ha n’ọnụ ọgụgụ Ndịàmà Jehova, ma anyị na-anabata ha n’ọmụmụ ihe anyị. Ọtụtụ n’ime ha na-abịa Ncheta Ọnwụ Kraịst kwa afọ. Otú anyị si amata ole ha dị bụ ịgbakọ mmadụ ole bịara Ncheta ọnwụ Jizọs, wepụzie mmadụ ole bụ́ Ndịàmà Jehova na ya. N’2023, ndị bịara Ncheta ọnwụ Jizọs dị 20,461,767.

 Baịbụl anyị na-amụrụ ndị mmadụ n’ụlọ ha n’anaghị ha ego na-abara ọtụtụ ndị na-anaghị abịa ọmụmụ ihe anyị uru. N’2023, ndị anyị mụụrụ Baịbụl kwa ọnwa dị 7,281,212. Mgbe ụfọdụ, a na-amụrụ ụfọdụ n’ime ha ihe n’otu mgbe.

Gịnị mere ole gọọmenti kwuru na unu dị ji karịa ole unu kwuru na unu dị?

 Otú ndị ọchịchị si enweta ọnụ ọgụgụ nke ha bụ ịjụ ndị mmadụ okpukpe ha na-ekpe. Dị ka ihe atụ, Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Ịgụ Ndị Mmadụ Ọnụ n’Amerịka kwuru na ihe ha bu n’obi ná nchọpụta ha mere bụ ka ha mata ma ndị mmadụ hà ga-asị na e nwere okpukpe ha nọ na ya. Ha kwukwara na ọ bụ okpukpe ndị mmadụ kwuru na ha nọ na ya ka ha ji kpebie mmadụ ole ha dere, ọ bụghị ma hà nọ n’okpukpe ahụ n’eziokwu. Ma, otú anyị si agụ nke anyị dị iche. Ọ bụ naanị ndị na-ekwusa ozị ọma ma na-agwa anyị awa ole ha ji kwusaa ozi ọma ka anyị na-agụnye ná Ndịàmà Jehova, ọ bụghị ndị na-ekwu na ha bụ Ndịàmà Jehova.

a Afọ ije ozi na-amalite n’abalị mbụ n’ọnwa Septemba ruo n’abalị iri atọ na otu n’ọnwa Ọgọst nke afọ n’eso ya. Dị ka ihe atụ, afọ ije ozi 2015 malitere n’abalị mbụ n’ọnwa Septemba afọ 2014 gwụ n’abalị iri atọ na otu n’ọnwa Ọgọst afọ 2015.