Gaa n'Isiokwu

Ha Kwụsịrị Ka Ha Nyere M Aka

Ha Kwụsịrị Ka Ha Nyere M Aka

 Bob, onye bi n’Albeta dị na Kanada, nọ na-anya ụgbọala ya otu ụbọchị ezigbo oyi na-atụ, ifufe ana-efesikwa ike. Ụgbọala ya nọ n’ọsọ mgbe taya azụ ya gbara na mberede. Bob amaghị ihe merenụ. N’ihi ya, ọ nyaara ụgbọala ya na-aga ebe ọ fọrọ obere ka ọ laruo.

 O dere akwụkwọ ozi ziga ya n’Ụlọ Nzukọ Alaeze Ndịàmà Jehova dị n’ebe ahụ. Bob kọwara ihe ọzọ merenụ ka ọ nya ụgbọala ya ahụ na-ala. Ọ sịrị: “Ụmụ okorobịa atọ na ụmụ agbọghọ abụọ ndị nọ n’otu ụgbọala gbaturu windo ụgbọala ha ma gwa m na taya m dara ada. Mgbe anyị kwụsịrị, ha gwara m ka ha nyere m aka gbanwee ya. Amaghịdị ma m̀ nwere taya ọzọ na ihe e ji ebuli ụgbọala elu. Ka m nọ ọdụ n’ígwè ndị ngwọrọ m n’akụkụ ụzọ, ha bara n’okpuru ụgbọala m ma wepụta taya na ihe e ji ebuli ụgbọala, ma gbanweere m taya ahụ. Ezigbo oyi nọ na-atụ n’oge ahụ, snoo nọkwa na-ada. N’agbanyeghị na ha jikeere ọfụma, ha nyeere m aka mụ enwee ike ịgawa ebe m na-aga. A gaaraghị m emeli ya n’onwe m.

 “M na-ekele Ndịàmà Jehova ise a nyeere m aka. Ha nọ na-aga n’ụlọ ndị mmadụ na-ezi ha ozi ọma. N’eziokwu, ha na-eme ihe ha na-akụziri ndị mmadụ. Ha nyeere m ezigbo aka, ma ọ́ bụghị ya, ọ gaara ara m ezigbo ahụ́ n’ụbọchị ahụ. Obi dị m ụtọ maka ihe ahụ ha meere m. Àmakwanụ m na a ga-enwe ọmarịcha ụmụaka dị otú ahụ n’okporo ụzọ n’ụbọchị ahụ?”