Gaa n'Isiokwu

Ha Chere na Ọ Bụ Pastọ Ha

Ha Chere na Ọ Bụ Pastọ Ha

 Otu nwanna aha ya bụ Osman, nwunye ya, na nwa ha nwaanyị ji ihe a na-akwagharị akwagharị na-ezi ozi ọma n’ihu ebe a na-eli ozu na Chili. Ka ha nọ ebe ahụ, ìgwè mmadụ ndị bịara ili ozu tiiri egwú bịa. Ụfọdụ n’ime ha chere na Osman bụ pastọ ha. N’ihi ya, ha ji obi ụtọ makụọ ya ma kelee ya maka otú o si bịarute ebe ahụ n’oge. Ha gwara ya, sị, “Pastọ, i meela bịa n’oge, anyị nọ na-atụ anya gị.”

 Osman gbalịrị ịkọwara ha na ya abụghị pastọ ha, ma ụzụ ha nọ na-eme ekweghị ha ghọta ihe ọ na-ekwu. Obere oge ìgwè mmadụ ahụ banyechara n’ebe ahụ a na-eli ozu, ụfọdụ n’ime ha bịaghachiri ma gwa Osman, sị, “Pastọ, anyị na-eche gị.”

 Mgbe ebe niile datụrụ jụụ, Osman kọwaara ha onye ọ bụ nakwa ihe mere o ji nọrọ ebe ahụ. Mgbe ha chọpụtara na Osman abụghị pastọ ha, ha kwuru na ezigbo iwe ji ha maka na pastọ ha abịaghị olili ozu ahụ. Ha jụziri Osman, sị, “Ị̀ ga-abịanụ jiri Baịbụl gwatụ anyị Okwu Chineke?” Osman kwetara ịga.

 Ka ha nọ na-aga ebe ahụ a na-eli ozu, Osman jụtara ha ihe ụfọdụ gbasara onye ahụ nwụrụ anwụ, cheekwa banyere amaokwu Baịbụl ụfọdụ ọ ga-agụrụ ha. Mgbe ha rutere ebe a ga-eli onye ahụ nwụrụ anwụ, ọ gwara ìgwè mmadụ ahụ onye ọ bụ. Ọ gwara ha na ya bụ Onyeàmà Jehova nakwa na ya na-ezi ndị mmadụ ozi ọma.

 Ọ gụziri Mkpughe 21:3, 4 na Jọn 5:28, 29 ma kọwaara ha na ọ bụghị uche Chineke ka ụmụ mmadụ na-anwụ anwụ. Ọ gwakwara ha na Chineke ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ, ha adịrị ndụ n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi. Mgbe Osman kwuchara, ọtụtụ n’ime ìgwè mmadụ ahụ ji obi ụtọ makụọ ya, keleekwa ya maka ozi ọma o ziri ha. Osman laghachiziri ebe ha dowere ihe a na-akwagharị akwagharị.

 Mgbe ìgwè mmadụ ahụ lichara onye ahụ nwụrụ anwụ, ụfọdụ n’ime ha gara ebe ahụ Osman na ndị ezinụlọ ya ji ihe a na-akwagharị akwagharị na-ezi ozi ọma ma jụọ ha ajụjụ ụfọdụ gbasara Baịbụl. Ha na ha kwutekwara okwu aka. Mgbe ndị ahụ bịara ili ozu lawara, ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na ha wechaara akwụkwọ niile dị n’ihe ahụ a na-akwagharị akwagharị Osman hà ji na-ezi ozi ọma.