Gaa n'Isiokwu

BAỊBỤL NA-AGBANWE NDỤ NDỊ MMADỤ

E Nwetala M Ihe Nrite Kacha Ihe Nrite Niile

E Nwetala M Ihe Nrite Kacha Ihe Nrite Niile
  • AFỌ A MỤRỤ M: 1967

  • EBE M SI: FINLAND

  • NDỤ M BIRI: ONYE JI ỊKỤ TENIS MERE AKA ỌRỤ

NDỤ M BIRI NA MBỤ

 A mụrụ m na Finland, n’otu ime obodo a na-akpọ Tampere. Ndị ezinụlọ anyị abụghị ndị oké chọọchị, ma ha ejighị ihe gbasara agụmakwụkwọ na ịkpa àgwà ọma egwuri egwu. Mama m bụ onye Jamani. Mgbe m dị obere, m na-adị aga ebe nne na nna m ochie bi na West Jamani, mụ na ha anọtụ.

 Ime egwuregwu na-atọ m ụtọ kemgbe m bụ obere nwa. N’oge ahụ, m mere egwuregwu dị iche iche, ma mgbe m dị ihe dị ka afọ iri na anọ, m kpebiri na egwuregwu m ga-abụzi naanị tenis. Mgbe m dị afọ iri na isii, m na-aga amụgharị otú e si akụ tenis ugboro abụọ ma ọ bụ atọ kwa ụbọchị. Mụ na koochi m na-aga ugboro abụọ n’ụbọchị, ná mgbede mụ agazie sọọsọ m. Nkà dị iche iche e nwere n’egwuregwu tenis na-atọgbu m atọgbu. M na-eji ịkụ tenis eme onwe m obi ụtọ, jirikwa ya emega ahụ́. Ọ bụ eziokwu na mụ na ndị enyi m na-anọ mgbe ụfọdụ ṅụtụ mmanya, o nweghị mgbe m nwere nsogbu n’ihi ịṅụ ọgwụ ọjọọ ma ọ bụ ịṅụ oké mmanya. Naanị ihe m na-eche bụ ịkụ tenis. E nweghị ihe dị m ka ya.

 M malitere iso n’asọmpi ndị bụ́ ọkaibe n’ịkụ tenis, a na-akpọ ATP, mgbe m dị afọ iri na asaa. a Mgbe m meriri n’asọmpi ụfọdụ m so mee, aha m bịara dewe ude n’obodo anyị. Mgbe m dị afọ iri abụọ na abụọ, esozi m ná mmadụ iri ise kacha akụ tenis n’ụwa niile.

 M gara mba dị iche iche n’ụwa kụọ tenis ruo ọtụtụ afọ. Ahụrụ m ụfọdụ ebe ndị mara ezigbo mma n’ụwa. Achọpụtakwara m na ọtụtụ nsogbu ndị dị ka, ime mpụ, ịṅụ ọgwụ ọjọọ nakwa imetọ ebe obibi, zuru ebe niile n’ụwa. Dị ka ihe atụ, mgbe anyị gara Amerịka, e nwere ebe ụfọdụ a gwara anyị agala n’ihi ọtụtụ ihe ọjọọ a na-eme ebe ndị ahụ. Ihe a niile mere ka obi na-ajọ m njọ. N’agbanyeghị na tenis m na-akụ na-atọ m ụtọ, o meghi ka m na-enwe obi ụtọ.

OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M

 Enyi m nwaanyị na Ndịàmà Jehova malitere ịmụ Baịbụl. Achịtụrụ m ha ọchị, ma akwụsịghị m ya ịmụ Baịbụl. Anyị lụrụ n’afọ 1990, e mekwara ya baptizim n’afọ ọzọ ya. Mụnwa abụghị onye chọọchị, ma ekweere m na Chineke dị. M chetara na mama nnukwu m, bụ́ onye Jaman, na-agụkarị Baịbụl. Ọ kụzidịịrị m otú e si ekpe ekpere.

 Otu ụbọchị, mụ na Sanna nwunye m gara na nke otu di na nwunye bụ́ Ndịàmà Jehova. Di nwaanyị ahụ aha ya bụ Kari gosiri m amụma Baịbụl nke kwuru banyere “oge ikpeazụ.” (2 Timoti 3:1-5) Nke a tụrụ m nnọọ n’anya. Ma o mere ka m ghọta ihe mere imi na anya ji dị ụwa otú ọ dị ya ugbu a. N’ụbọchị ahụ, anyị ekwuchaghị ọtụtụ ihe banyere okpukpe. Si n’ụbọchị ahụ gawa, mụ na Kari bidoro kwuwe ihe banyere Baịbụl. Ihe ndị m na-amụta bụ nnọọ eziokwu. Ihe ndị m na-eme, nakwa ọtụtụ njem m na-eme mere ka anyị ghara ịna-amụ ihe mgbe niile. Ma, o meghị ka ike gwụ Kari ịmụrụ m Baịbụl. Kama, ọ na-edetara m akwụkwọ ozi iji zaa ajụjụ ndị m jụrụ ya n’oge anyị na-amụ ihe. Baịbụl zara ajụjụ niile dị mgbagwoju anya mmadụ nwere ike ịjụ gbasara ndụ. M jikwa nwayọọ nwayọọ na-aghọta isi ihe Baịbụl na-ekwu, ya bụ, na Alaeze Chineke ga-eme ka uche Chineke mezuo. Aha Chineke m mụtara nakwa ịhụ ihe ndị o meerela anyị ruru m n’obi. (Abụ Ọma 83:18) Nke kacha ruo m n’obi bụ ihe mgbapụta o nyere anyị. O nyeghi ya naanị iji mezie ihe e mebiri ma ọ bụkwanụ iji mezuo iwu, kama ọ bu iji gosi na ọ hụrụ anyị n’anya. (Jọn 3:16) Amụtakwara m na m nwere ike ịbụ enyi Chineke, ma dịrị ndụ ebighị ebi na paradaịs nke udo ga-adị na ya. (Jems 4:8) M malitere ịjụ onwe m, sị “Olee ihe m ga-eme iji gosi na obi dị m ụtọ?”

 M bịara chebara ụdị ndụ m na-ebi echiche. Amụtara m na Baịbụl na ihe kacha eme ka mmadụ na-enwe obi ụtọ bụ inye ihe. Achọkwara m ịgwa ndị ọzọ ihe ndị m kweere. (Ọrụ Ndịozi 20:35) Ebe m ji ịkụ tenis mere aka ọrụ, m na-eji ihe dị ka narị ụbọchị abụọ n’afọ aga akụ tenis n’ebe dị iche iche. Oge ndị m ji anata ọzụzụ n’ịkụ tenis, ihe ndị m na-eme kwa ụbọchị, nakwa tenis m na-akụ anaghị enye m ohere ilebara ezinụlọ m anya. M chọpụtara na m kwesịrị ịhapụ ihe ụfọdụ m ji oge m na-eme.

 Ama m na ọtụtụ ndị agaghị aghọta ihe mere m ga-eji ahapụ ịkụ tenis m na-enweta ezigbo ego na ya maka ihe gbasara okpukpe. Ma, ohere m nwere ịmatakwu Jehova nakwa inweta ndụ ebighị karịrị ihe ọ bụla m nwere ike irite n’ịkụ tenis. N’ihi ya, o sirighị m ike ikpebi ihe m ga-eme. M kpebisiri m ike na o nweghị ihe ga-eme ka m laghachi azụ n’ime ihe m kpebiri, ihe ọ sọkwara ndị mmadụ kwuo. Amaokwu Baịbụl gbara m ume ịkwụsi ike ná mkpebi a m mere bụ Abụ Ọma 118:6. Ebe ahụ sịrị: “Jehova nọnyeere m; agaghị m atụ egwu. Gịnị ka mmadụ pụrụ ime m?”

 Mgbe obere oge gachara, ụfọdụ ndị na-akwado anyị kwere m nkwa ịkwụ m ezigbo ego nke ga-eme ka m nọgide na-akụ tenis ruo ọtụtụ afọ ma ghara ịna-echegbu onwe m. Ebe ọ bụ na ekpebiela m ihe m ga-eme, ekweghị m anara ọrụ ahụ. M mechakwara kwụsị ịkụ tenis n’òtù ATP ahụ m nọ na ya. M nọgidere na-amụ Baịbụl, e meekwa m baptizim n’abalị abụọ n’ọnwa Julaị afọ 1994, mụ aghọọ Onyeàmà Jehova.

URU NDỊ M RITERELA

 O nweghị ihe ike mere m nke mere ka m chewe banyere Chineke. M gaghịkwa ekwu na m nọ na-achọ ịmụta eziokwu ndị dị na Baịbụl. M lere onwe m anya ka onye ihe niile zuuru. Ma, achọpụtara m na e nwere ihe ndị bara uru mere anyị ji dịrị ndụ, chọpụtakwa na ndụ m akakwuola mma otú m na-atụghị anya ya. Ọ dị ka à ga-asị na eziokwu dị na Baịbụl nọ na-eche m ka m chọta ya. Ezinụlọ anyị akakwuola mma, anyị adịkwuokwa n’otu. Obi dịkwa m ezigbo ụtọ na ụmụ m ndị nwoke atọ sokwa m na-efe Jehova, kama ịbụ ndị na-akụ tenis.

 Ịkụ tenis ka na-atọ m ụtọ. Ihe m ji na-akpa afọ ezinụlọ anyi kemgbe ọtụtụ afọ ugbu a bụ ihe gbasara ịkụ tenis. Ana m akụziri ndị mmadụ otú e si akụ tenis, bụrụkwa manịja n’ebe a na-akụ tenis. Ma, ejighizi m oge m niile na-eme egwuregwu. Na mbụ, m na-eji ọtụtụ awa kwa izu na-amụ otú m ga-esi bụrụ aka ochie ma ọ bụ azụ eru ala n’ịkụ tenis. Ma ugbu a, abụzi m onye na-ezisa ozi ọma oge niile. Obi dịkwa m ụtọ iji oge buru ibu na-enyere ndị ọzọ aka ịmụ Baịbụl nakwa ime ihe ndị Baịbụl kwuru, bụ́ ihe ndị nyeere m aka ịgbanwe ndụ m. Ma, ihe kacha eme ka obi na-atọ m ụtọ bụ na eji m adị ná mma mụ na Jehova Chineke kpọrọ ihe, na-akụzikwara ndị ọzọ gbasara olileanya magburu onwe ya m nwere maka ọdịnihu.—1 Timoti 6:19.

a ATP bụ aha ọzọ a na-akpọ òtù jikọtara ndị niile ji ịkụ tenis mere aka ọrụ. Ọ bụ ya na-ahụ maka asọmpi nke ụmụ nwoke ndị ji ịkụ tenis mere aka ọrụ. Ihe ọzọ bụ na ndị bụ́ aka ochie n’ịkụ tenis na-anọ na ya asọ mpi onye ga-akacha mee nke ọma. Mgbe ha na-akụ tenis, a na-agụ akara ole onye nke ọ bụla nwetara, nyekwa ndị kacha mee nke ọma ihe nrite. Ọ bụ akara ole mmadụ nwetara n’ebe dị iche iche ọ kụrụ tenis ga-ekpebi ma ọ̀ ga-abụ onye nke mbụ, onye nke abụọ ma ọ bụ karịa ná ndị na-akụ tenis n’ụwa niile.