Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | Ị̀ GA-ACHỌ ỊMỤ BAỊBỤL?

Olee Uru Ịmụ Baịbụl Ga-abara Gị?

Olee Uru Ịmụ Baịbụl Ga-abara Gị?
  • Gịnị ka m kwesịrị iji ndụ m eme?

  • Gịnị mere ndị mmadụ ji na-ata ahụhụ ma na-anwụ anwụ?

  • Olee otú ihe ga-adị n’ọdịnihu?

  • Ihe banyere m ọ̀ na-emetụ Chineke n’obi?

Ò nwetụla mgbe ị jụrụ onwe gị ụdị ajụjụ ndị a? Ọ bụrụ na o nwetụla, ọ bụghị naanị gị ka ụdị ajụjụ ndị a na-echu ụra. Ọtụtụ ndị nọ n’ebe dị iche iche n’ụwa na-ajụ ajụjụ ndị a. Ma, ị̀ ga-amatali azịza ha?

A jụọ ọtụtụ ndị, ha ga-asị “ee.” Olee ihe mere ha ga-eji asị “ee”? Ọ bụ n’ihi na ha amatala ọtụtụ azịza ajụjụ ndị na-echu ha ụra na Baịbụl. Ị̀ ga-achọ ịma ihe Baịbụl na-akụzi? Ọ bụrụ na ị ga-achọ, gbalịa ka gị na Ndịàmà Jehova malite ịmụ Baịbụl. * Ha agaghị ana gị ego maka ihe unu ga-amụ.

Ma, a sị ụfọdụ ndị bịa mụọ Baịbụl, ha asị na ha ji ihe n’aka, ma ọ bụ na Baịbụl siri ike ọmụmụ, ma ọ bụkwanụ na ike Baịbụl adịghị ha. Ma, o nwere ndị na-anaghị ekwu otú ahụ. A sị ha bịa mụọ Baịbụl, ha abịa ozugbo. Lee ihe ụfọdụ n’ime ha kwuru:

  • Otu nwaanyị onye Ingland aha ya bụ Gill kwuru, sị: “Ekpeela m Katọlik, kpee Anglịkan, kpee okpukpe ndị Sik, kpee nke ndị Buda, gụọkwa gbasara okpukpe na mahadum. Ma, amatalighị m azịza ajụjụ ndị m na-ajụ gbasara Chineke. Ma, otu ụbọchị, otu nwaanyị Onyeàmà Jehova bịara ozi ọma n’ụlọ m. Otú o si jiri Baịbụl zaa m ajụjụ niile m jụrụ ya mere ka m kweta ka mụ na ya mụwa Baịbụl.”

  • Otu nwoke onye Bene Ripọblik aha ya bụ Koffi kwuru, sị: “Ajụrụ m pastọ anyị ọtụtụ ajụjụ ndị na-echu m ụra, ma ihe ọ zara m ejughị m afọ. Ma, mgbe m jụrụ otu Onyeàmà Jehova ajụjụ ndị ahụ, o ji naanị Baịbụl zaa m ha niile. Mgbe ọ jụrụ m ma m̀ ga-achọ ịmatakwu ihe ndị ọzọ dị na Baịbụl, ekwetara m ozugbo.”

  • Otu nwoke onye Brazil aha ya bụ José sịrị: “M chọsiri ike ịma ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ. Ekweere m na ndị nwụrụ anwụ nwere ike imesi ndị dị ndụ ike, ma achọrọ m ịma ihe Baịbụl kwuru. M bidoziri soro otu enyi m bụ́ Onyeàmà Jehova mụwa Baịbụl.”

  • Otu nwaanyị onye Meksiko aha ya bụ Dennize kwuru na ya agbalịala ịgụ Baịbụl, ma o kweghị ya nghọta. Mana ọ sịrị na otu ụbọchị Ndịàmà Jehova bịara ozi ọma na nke ya, ha kọwaara ya ụfọdụ amụma ndị dị na Baịbụl, ha edoo ya anya, nakwa na o mere ka ya chọwa ịmata ihe ndị ọzọ dị na Baịbụl.

  • Otu nwaanyị onye Nepal aha ya bụ Anju kwuru, sị: “Ọ na-eme m obi abụọ ma ihe banyere m ọ̀ na-emetụkwa Chineke n’obi. M gwara ya Chineke n’ekpere. N’echi ya, Ndịàmà Jehova bịara na nke m. Mgbe ha gwara m na ha ga-achọ ka mụ na ha mụwa Baịbụl, m kwetakwara.”

Ihe a niile ndị mmadụ kwuru na-echetara anyị otu ihe Jizọs kwuru na Baịbụl. Ọ sịrị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị maara mkpa ime mmụọ ha.” (Matiu 5:3) N’eziokwu, Chineke kere anyị ka ọ na-agụ anyị agụụ ịma gbasara ya. Ọ bụkwa naanị ya ga-emeli ka anyị mata onye ọ bụ. O ji Okwu ya bụ́ Baịbụl eme ka anyị mata ya.

Oleezi otú Ndịàmà Jehova na ndị mmadụ si amụ Baịbụl? Olee uru ịmụ Baịbụl ga-abara gị? A ga-aza ajụjụ ndị a n’isiokwu na-eso nke a.

^ para. 8 Baịbụl kwuru na aha Chineke bụ Jehova.