Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | GỊNỊ KA Ị GA-EME KA ỌRỤ GỊ NA-ATỌ GỊ ỤTỌ?

Ọ̀ Ka Bara Uru Ịna-arụsi Ọrụ Ike?

Ọ̀ Ka Bara Uru Ịna-arụsi Ọrụ Ike?

E nwere otu nwoke aha ya bụ Alex. Ọ na-arụ n’ụlọ ọrụ na-akwafere ndị mmadụ ngwongwo ha ebe ọzọ. Otu ụbọchị, ka o bubachara otu nnukwu katọn n’ụgbọala ụlọ ọrụ ha, ọ gara nọrọ na-asụ ude. Ọ malitere ịjụ onwe ya, sị: ‘Olee mgbe m ga-akwụsị ọrụ a na-enweghị ezigbo ego dị na ya? Olee mgbe m ga-enweta ezigbo ọrụ? Ọ gaakwaranụ akara m mma ma á sị na m na-arụ obere ọrụ na-enye m ezigbo ego.’

Otú a ọ dị Alex ka ọ dịkwa ọtụtụ ndị taa. Ha anaghị achọ ịrụsi ọrụ ike. E nwere ihe Aaron, bụ́ otu nwoke na-arụzi ụgbọala, kwuru. Ọ sịrị: “Ọtụtụ ndị chere na ha akarịala ọrụ ha na-arụ n’ihi na ọ bụ ọrụ a na-eleda anya. Ebumnobi ha bụ ka ha na-arụgodị ya ruo mgbe ha ga-enweta ọrụ ka ya mma.”

Gịnị mere ọtụtụ ndị ji eche na ha ekwesịghị ịna-arụ ọrụ siri ike? Ọ ga-abụ na ihe mere ha ji eche otú ahụ bụ n’ihi na ndị ụlọ ọrụ mgbasa ozi na-emekarị ka ndị mmadụ na-eche na ha ekwesịghị ịna-enye ndụ ha nsogbu. Otu nwoke na-arụzi ụlọ aha ya bụ Matthew sịrị na “ndị mmadụ na-ekwu na ọ na-abụ mmadụ na-arụsikwu ọrụ ike, obi ana-ajọkwu ya njọ.” Otu nwoke na-arụzikwa ụlọ aha ya bụ Shane kwukwara ihe yiri ihe a Matthew kwuru. Ọ sịrị: “Ihe ndị mmadụ chọziri ugbu a bụ ha na-arụ obere ọrụ, a na-akwụ ha nnukwu ụgwọ.”

Ma, ọtụtụ ndị na-enwe obi ụtọ bụ ndị na-arụsi ọrụ ike. O nwere ihe otu nwa okorobịa dị afọ iri abụọ na ise aha ya bụ Daniel kwuru. Nwa okorobịa a na-arụ ụlọ. O kwuru, sị: “Mmadụ ịrụsi ọrụ ike na-atọ ụtọ, karịchaa ma ọ bụrụ na ihe onye ahụ na-arụ bụ ihe ga-aba ezigbo uru.” Nwa okorobịa ọzọ dị afọ iri abụọ na atọ aha ya bụ Andre, kwukwara ihe yiri ihe a Daniel kwuru. Ọ sịrị: “Ekwetara m na ịrụsi ọrụ ike na-eme ka mmadụ nwee obi ụtọ. Ma, naanị ihe ịrụ obere ọrụ ga-akpatara mmadụ bụ ike ọgwụgwụ na obi ọjọọ.”

Gịnị nyeere Daniel, Andre na ndị ọzọ aka ile ịrụsi ọrụ ike anya otú kwesịrị ekwesị? Ọ bụ ime ihe Baịbụl kwuru. Baịbụl na-agba anyị ume ka anyị na-adị uchu n’ọrụ anyị. Baịbụl gwakwara anyị ihe anyị ga na-eme ka ọrụ anyị nwee ike na-atọ anyị ụtọ.

Olee ihe ụfọdụ Baịbụl kwuru ga-enyere gị aka ịna-enwe obi ụtọ n’ọrụ gị? Biko, gụọ isiokwu na-eso nke a ka ị hụ ha.