Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | GỊ NA CHINEKE NWERE IKE ỊDỊ NÁ MMA

Ọ̀ Dị Gị Ka Gị na Chineke Ọ̀ Dị ná Mma?

Ọ̀ Dị Gị Ka Gị na Chineke Ọ̀ Dị ná Mma?

“Ọ bụrụ na gị na Chineke adịrị ná mma, obi ga na-eru gị ala, ọ gaghịkwa adị gị ka ò nwere ihe kọrọ gị. Ọ ga na-adị gị ka Chineke ọ̀ na-achọ ka ihe na-agaziri gị mgbe niile.”—CHRISTOPHER, NWA OKOROBỊA BI NA GANA.

“Chineke na-ahụ nsogbu gị niile, ọ na-agbatara gị ọsọ enyemaka karịa otú ị tụrụ anya ya.”—HANNAH, NWATA NWAANYỊ DỊ AFỌ IRI NA ATỌ BI N’ALASKA, N’AMERỊKA.

“O nweghị ihe dị ka mmadụ ịmara na ya na Chineke dị ná mma n’ihi na ahụ́ na-eru onye ahụ ala ma ya na Chineke dịrị ná mma.”—GINA, NWAANYỊ JAMEIKA DỊ IHE DỊ KA AFỌ IRI ANỌ NA ISE.

Ọ bụghị naanị Christopher, Hannah, na Gina chere na ha na Chineke dị ná mma. N’ebe niile n’ụwa, obi siri ọtụtụ ndị ike na Chineke bụ enyi ha. Gịnwa kwanụ? Ọ̀ dị gị ka gị na Chineke ọ̀ dị ná mma? Ka ị̀ chọrọ ka gị na ya dịrị ná mma ma ọ bụkwanụ dịrịkwuo ná mma? Ma, i nwere ike na-eche, sị: ‘Mmadụ nkiti na Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile hà nwere ike ịdị ná mma? Ọ bụrụ otú ahụ, olee ihe mmadụ ga-eme ka ya na Chineke dịrị ná mma?’

GỊ NA CHINEKE NWERE IKE ỊDỊ NÁ MMA

Baịbụl mere ka anyị mata na mmadụ na Chineke nwere ike ịdị ná mma. Baịbụl kwuru na Chineke kpọrọ onye Hibru aha ya bụ Ebreham “enyi m.” (Aịzaya 41:8) Ihe ọzọ bụ na a gwara anyị na Jems 4:8, sị: “Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso.” Nke a pụtara na mmadụ na Chineke nwere ike ịdị ná mma ma ọ bụkwanụ bụrụ enyi. Ma, ebe ọ bụ na mmadụ enweghị ike ịhụ Chineke anya, oleezi otú ị ga-esi ‘bịaruo’ ya nso, gị na ya adịrịkwa ná mma?

Ka anyị leba anya n’otú mmadụ na ibe ya si ebido ịbụ enyi n’ihi na ọ ga-enyere anyị aka ịmata azịza ajụjụ a. Ihe mbụ mmadụ abụọ chọrọ ịbụ enyi na-ebukarị ụzọ eme bụ ịmata aha ibe ha. Ha na-amalitezi ikwurịta okwu, na-agwa ibe ha ihe ha chere na otú obi dị ha. Ha na-ejizi nwayọọ nwayọọ bụrụ enyi. Ọ bụrụ na ha abụọ agbalịa na-enyere ibe ha aka, ha ga-abụzi ezigbo enyi. Ọ bụkwa otú a ka Chineke na onye chọrọ ka ya na ya dịrị ná mma nwere ike isi dị ná mma. Ka anyị leba anya n’ihe mere anyị ji kwuo otú ahụ.