Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE Ị GA-EME KA Ị KWỤSỊ ỊKPỌ NDỊ ỌZỌ ASỊ

1 | Elela Mmadụ Anya n’Ihu

1 | Elela Mmadụ Anya n’Ihu

Ihe Baịbụl Kwuru:

“Chineke anaghị ele mmadụ anya n’ihu. Kama ná mba ọ bụla, ọ na-anabata onye na-atụ egwu ya, nke na-emekwa ihe dị mma.”​ỌRỤ NDỊOZI 10:​34, 35.

Ihe Ọ Pụtara:

Jehova * Chineke anaghị eji obodo anyị, agbụrụ anyị, otú anyị na-acha ma ọ bụkwanụ omenala anyị ekpebi ụdị mmadụ anyị bụ. Kama, ihe ka ya mkpa bụ otú anyị si eche echiche na ihe ndị na-agụ anyị agụụ. N’eziokwu, “mmadụ na-ahụ ihe anya na-ahụ, ma Jehova na-ahụ ihe dị n’obi.”​—1 Samuel 16:7.

Ihe I Nwere Ike Ime:

Anyị enweghị ike ịmata ihe dị mmadụ n’obi. Ma, anyị nwere ike ịgbalị na-eme ka Jehova ma ghara ịna-ele ndị mmadụ anya n’ihu. Gbalịa ka ị mata mmadụ nke ọma kama iwere ya otú ndị ọzọ si ewere ndị obodo ha. Ị chọpụta na ị na-ele ndị mmadụ anya ọjọọ, ma eleghị anya, n’ihi na ha si n’agbụrụ ọzọ ma ọ bụkwanụ n’obodo ọzọ, rịọ Chineke ka o nyere gị aka ịkwụsị ya. (Abụ Ọma 139:​23, 24) I jiri obi gị niile rịọ Jehova ka o nyere gị aka ka ị ghara ile mmadụ anya n’ihu, obi kwesịrị isi gị ike na ọ ga-anụ ekpere gị ma nyere gị aka.​—1 Pita 3:12.

^ Jehova bụ ezigbo aha Chineke.​—Abụ Ọma 83:18.

“Mụ na onye ọcha anọtụbeghị ọdụ kwurịta okwu n’udo . . . Ugbu a, eso m n’ezigbo ụmụnna nọ n’ụwa dum.”​—TITUS