Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otu Ihe Ọma Onye Kraịst Mere

Otu Ihe Ọma Onye Kraịst Mere

NNA John bụ Onyeàmà Jehova. E mere ya baptizim afọ iri isii gara aga. O bi n’otu obere obodo dị na Gujarat nke dị n’India. John na ụmụnne ya ndị nwaanyị atọ na ndị nwoke abụọ, nakwa mama ha bu Chọọchị Katọlik n’isi. N’ihi ya, ha nọ na-enye papa ha nsogbu maka na ọ bụ Onyeàmà Jehova.

Otu ụbọchị, papa John gwara ya ka o wegara otu nwanna nọ n’ọgbakọ ha akwụkwọ ozi. Nwanna a bụ enyi papa John. Ma, n’ụtụtụ ahụ John merụrụ ezigbo ahụ́ na mkpịsị aka ebe ọ na-achọ imeghe nnukwu drọm e ji ígwè rụọ. Ma, ọ chọrọ ime ihe papa ya gwara ya, n’ihi ya, o ji ákwà kechie mkpịsị aka ya ahụ na-agba ọbara ma gawa inye enyi papa ya ahụ akwụkwọ ozi ahụ.

Mgbe John rutere ebe ahụ, ọ hụrụ nwunye enyi papa ya ahụ ma nye ya akwụkwọ ozi ahụ. Nwaanyị ahụ bụ Onyeàmà Jehova. Mgbe ọ hụrụ ihe mere John na mkpịsị aka, ọ gwara John na ya ga-enyere ya aka. O bupụtara igbe ọgwụ ha, were mmiri ọgwụ hichaa ọnyá ahụ ma jiri bandeeji kechie ya. O meziiri John tii. N’oge niile ahụ ya na John nọ, o medara obi na-agwa John okwu gbasara Baịbụl.

N’ihi ihe ọma ndị ahụ nwanna nwaanyị ahụ meere John, ọ malitere ịgbanwe anya ọjọọ ahụ ọ na-ele Ndịàmà Jehova. John jụrụ nwanna nwaanyị ahụ ajụjụ abụọ banyere ihe Ndịàmà Jehova kweere nke dị iche n’ihe ndị Chọọchị Katọlik kweere. Ọ jụrụ ya ma Jizọs ọ̀ bụ Chineke, nakwa ma Ndị Kraịst hà kwesịrị ịrịọ Meri arịrịọ n’ekpere. Nwanna nwaanyị ahụ ma asụsụ Gujerati, bụ́ asụsụ John hà. Ọ bụkwa ya ka o ji zaa John ajụjụ ndị ọ jụrụ. O ji Baịbụl zaa ya ajụjụ ndị ahụ, nyekwa ya Akwụkwọ nta bụ́ “This Good News of the Kingdom.”

Mgbe John mechara gụọ akwụkwọ ahụ, ọ bịara doo ya anya na ihe ọ na-agụ bụ eziokwu. Ọ gakwuuru ụkọchukwu ha, jụọkwa ya ajụjụ abụọ ndị ahụ. Ezigbo iwe were ụkọchukwu ahụ, ya ewere Baịbụl tụọ John ma bawara ya mba. Ọ sịrị John: “Ị ghọọla Setan. Gosi m ebe Baịbụl kwuru na Jizọs abụghị Chineke. Gosikwa m ebe o kwuru na anyị ekwesịghị ife Meri. Ngwa gosi m ya.” Ihe a ụkọchukwu ahụ mere juru ya anya. Ọ gwara ụkọchukwu ahụ, sị: “Ụkwụ m agaghị akpa na Chọọchị Katọlik ọzọ.” Ụkwụ ya akpakwanụghị ebe ahụ ọzọ.

Ndịàmà Jehova malitere ịmụrụ John Baịbụl, ya agawa ọmụmụ ihe ma malite ife Jehova. Ka oge na-aga, ọtụtụ ndị ọzọ nọ n’ezinụlọ John hà batakwara n’ọgbakọ. Taa, John ka nwere àpà na mkpịsị aka aka nri ya ahụ o merụrụ ahụ́ n’ihe dị ka afọ iri isii gara aga. Ọ ka na-echeta ihe ọma ahụ Onye Kraịst ahụ meere ya nke mere ka ọ bata n’ọgbakọ.​—⁠2 Kọr. 6:​4, 6.