Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

TETA! Nke 3 n'Afọ 2021 | Ì Kwesịrị Ikwere na E Nwere Onye Okike? Lee Ihe Ga-enyere Gị Aka Ikpebi

A bịa n’otú eluigwe na ụwa na ihe ndị dị ndụ si bido, ihe ndị mmadụ kweere dị iche iche. Gụọ Teta! a ka ị mata ihe ụfọdụ dị ịtụnanya gbasara okwu a. Ọ ga-enyere gị aka ikpebi ihe gịnwa ga-ekwere. Ihe niile hà nọkatara nnọọ jiri aka ha dịrị ka è nwere Onye kere ha? Ịmata azịza ajụjụ a ga-abara gị ezigbo uru.

 

Gịnị Ga-enyere Gị Aka Ịma Ihe Ị Ga-ekpebi?

Ajụjụ gbasara otú ihe niile si dịwa na-agba ọtụtụ ndị gharịị.

Gịnị Ka Mbara Igwe na Ụwa Na-akụziri Anyị?

O yichara ka à haziri ihe ndị dị na mbara igwe na ihe ndị dị n’ụwa ka ha mee ka ibi n’ụwa a kwe omume. Ọ̀ ga-abụ na ihe mere ha ji dị otú a bụ n’ihi na e nwere onye haziri ha?

Gịnị Ka Ihe Ndị Dị Ndụ Na-akụziri Anyị?

Ihe ndị dị ndụ mere ka ụwa anyị a maa ezigbo mma. Gịnị ka ha na-akụziri anyị banyere otú ndụ si malite?

Ihe Ndị Sayensị Na-agaghị Akọwali

Ndị sayensị hà akọwaala kpọmkwem otú eluigwe na ụwa, nakwa ndụ si malite?

Ihe Baịbụl Kọwaara Anyị

Ihe ọ kọrọ ọ̀ dabara n’ihe ndị sayensị chọpụtarala?

Gịnị Mere Ịmata ma È Nwere Onye Okike Ji Dị Mkpa?

Ọ bụrụ na ihe ndị ị mụtara emee ka i kweta na e nwere Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile, ọ ga-abara gị uru ugbu a nakwa n’ọdịnihu.

Lee Ihe Ndị A Chọpụtara

Jiri aka gị kpebie ma è nwere ihe mere anyị kwesịrị iji kwere na e nwere onye kere ihe niile.