Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE NDỊ GA-ENYERE EZINỤLỌ AKA | NDỊ NA-ETO ETO

Otú Ị Ga-esi Edi Ọnwụ Nne ma Ọ Bụ Nna

Otú Ị Ga-esi Edi Ọnwụ Nne ma Ọ Bụ Nna

IHE MERE O JI ARA AHỤ́

Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Dami dị afọ isii mgbe ọrịa ụbụrụ gburu nna ya. Otu nwoke aha ya bụ Derrick dị afọ itoolu mgbe ọrịa obi gburu nna ya. Nwaanyị ọzọ aha ya bụ Jeannie dị afọ asaa mgbe ọrịa kansa mechara gbuo mama ya n’ime otu afọ ọ rịara ya. *

Mmadụ nwụnahụchara ụmụaka ndị a mgbe ha ka dị ezigbo ntakịrị. Ụdị ihe ahụ ò metụla gị? Ọ bụrụ na o metụla gị, isiokwu a ga-enyere gị aka idi ya. * Ma, ka anyị burugodị ụzọ leba anya n’ihe ụfọdụ gbasara iru uju.

IHE I KWESỊRỊ ỊMA

E nwere ọtụtụ ụzọ e si eru uju. Ọ pụtara na otú i si na-eru uju nwere ike ịdị iche n’otú ndị ọzọ si eru nke ha. Akwụkwọ bụ́ Helping Teens Cope With Death kwuru, sị: “E nweghị ụzọ a kapịrị ọnụ mmadụ ga-esirịrị na-eru uju onye nwụnahụrụ ya.” Ihe ka mkpa bụ ka mmadụ ghara izochi mwute ya. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na . . .

Mmadụ izochi nwute ọ na-enwe adịghị mma. Jeannie anyị kwuru okwu ya ná mmalite kwuru, sị: “M chere na m kwesịrị izochi nwute m nọ na-enwe ka ihe merenụ ghara iwutebiga nwanne m nke ntakịrị ókè. M ka na-emekwa ụdị ihe a ruo taa. M na-ezochikarị ihe ọ bụla na-enye m nsogbu. Ma, ọ dịkwanụghị mma.”

Ndị ọkachamara kwetakwara na ọ dịghị mma. Otu akwụkwọ aha ya bụ The Grieving Teen kwuru, sị: “Mmadụ agaghị ezochili ihe na-enye ya nsogbu ruo ebighị ebi. Otu ụbọchị, mgbe onye ahụ na-atụghị anya ya, ọ ga-abọlite. O nwere ike ịkpatara onye ahụ mkpaghasị uche ma ọ bụ ọrịa.” O nwekwara ike ime ka mmadụ bido ṅụwa ọgwụ ọjọọ ma ọ bụ oké mmanya iji chefuo nsogbu ya.

Iru uju nwere ike ịkpata mkpaghasị uche. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ndị na-ebido wewere onye ahụ nwụrụ anwụ iwe maka na ọ hapụrụ ha, ndị ọzọ ana-ata Chineke ụta n’ihi na ha chere na Chineke gaara egbochi ọnwụ onye ahụ. E nwekwara ndị nke na-akwa ụta maka ihe ha mere ma ọ bụ ihe ha gwara onye ahụ nwụrụ anwụ nke ha na-enwekwaghị ohere imezi.

Nke bụ́ eziokwu bụ na e nwere ọtụtụ ihe dị n’iru uju. Ma, olee ihe ga-enyere gị aka?

IHE I NWERE IKE IME

Kọsara mmadụ nsogbu gị. I nwere ike ịchọwa ịna-anọ naanị gị mgbe ị na-eru uju. Ma, ị gbalịa kọọrọ onye ezinụlọ unu ma ọ bụ enyi gị otú obi dị gị, ọ ga-enyere gị aka idi nsogbu gị na ya na-alụ.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ilu 18:24.

Nwee ebe ị na-edetu ihe. Detuo ihe ụfọdụ gbasara nne gị ma ọ bụ nna gị ahụ nwụrụnụ. Dị ka ihe atụ, olee ihe ndị kacha amasị gị banyere ya? Dee banyere àgwà ọma ndị o nwere. Olee àgwà ya ndị nke ị chọrọ iṅomi ná ndụ gị?

Ọ bụrụ na e nwere ihe ndị na-enye gị nsogbu n’obi, dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na o siiri gị ike ichefu okwu ọjọọ ị gwara ya tupu ya anwụọ, dee ya, deekwa ihe kpatara ya. I nwere ike ide, sị: “Obi m na-ama m ikpe n’ihi mba mụ na papa m bara tupu ya anwụọ.”

Chọpụta ma ụta ị na-ata onwe gị ò kwesịrị ekwesị. Akwụkwọ bụ́ The Grieving Teen kwuru, sị: “O kwesịghị ka ị tawa onwe gị ụta maka ihe i mejọrọ mgbe ị na-amaghị na ohere agaghị adị maka imezi ya. O nweghị onye ga-asị na mmadụ enweghị ike ikwu ma ọ bụ mee ihe ọ ga-emecha rịọ mgbaghara maka ya.”—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Job 10:1.

Na-elekọta onwe gị. Na-ezu ike nke ọma, na-emega ahụ́, na-erikwa nri nke ọma. Ọ bụrụ na agụụ a naghị agụ gị, gbalịa na-eme ị nọtụ gị eritụ nwa obere ihe, kama ịchọ ka i rie ihe buru ibu otu mgbe. Na-eme ya otú a ruo mgbe agụụ ga-ebidokwa ịgụ gị. Echela na iri nri ratụ ratụ na ịṅụ mmanya na-aba n’anya ga-eme ka ihe ka mma. Ọ ga-emedị ka ihe ka njọ.

Kọọrọ Chineke nsogbu gị. Akwụkwọ Nsọ sịrị: “Tụkwasị Jehova ibu arọ gị, ya onwe ya ga-akwadokwa gị.” (Abụ Ọma 55:22) Ekpere abụghị naanị maka ime ka mmadụ nwetatụ onwe ya. Ọ bụ ụzọ mmadụ na Chineke onye “na-akasi anyị obi ná mkpagbu anyị niile” si ekwurịta okwu.—2 Ndị Kọrịnt 1:3, 4.

Otu ụzọ Chineke si akasi ndị na-eru uju obi bụ site n’okwu ya, bụ́ Baịbụl. Gbalịa gụọ ya ka ị mata nke bụ́ eziokwu gbasara ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ, nakwa olileanya maka mbilite n’ọnwụ? *Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Abụ Ọma 94:19.

^ para. 4 I nwekwara ike ịgụ gbasara Dami, Derrick, na Jeannie n’isiokwu na-eso nke a.

^ para. 5 Ọ bụ eziokwu na ndị ihe e kwuru n’isiokwu a ga-akacha baara uru bụ ndị nne ha ma ọ bụ nna ha nwụnahụrụ, ma o nwekwara ike ịbara ndị nwanne ha ma ọ bụ enyi ha nwụnahụrụ uru.

^ para. 19 Gụọ isi nke 16 n’akwụkwọ bụ́ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 1. I nwere ike ịga na www.pr418.com/ig danloduo ya n’efu. Pịa ebe e dere IHE NDỊ ANYỊ NWERE.