Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE NDỊ GA-ENYERE EZINỤLỌ AKA | ỊZỤ ỤMỤ

Nyere Nwa Gị Aka Ka Ọ Mata Mgbanwe Ndị A Na-enwe n’Ahụ́

Nyere Nwa Gị Aka Ka Ọ Mata Mgbanwe Ndị A Na-enwe n’Ahụ́

IHE MERE O JI ESI IKE

A mụọ nwa, ọ naghị ara ahụ́ ya etoo, nwa ahụ e kubu n’aka achụwa afọ iri. Ọ bụ eziokwu na ọ ka bụ nwatakịrị, ma, o nwere ike ịbụ na o toruwela oge ahụ́ ya ga-amalite ịgbanwe.

Olee otú ị ga-esi enyere ya aka n’oge a ọ na-etolite, bụ́ mgbe mgbanwe ndị ọ na-ahụ n’ahụ́ ya ga na-enye ya nsogbu n’obi?

IHE I KWESỊRỊ ỊMA

Ahụ́ mmadụ niile abụghị otu. Ahụ́ nwatakịrị nwere ike ịmalite ịgbanwe mgbe ọ dị naanị afọ asatọ. O nwekwara ndị nke ha na-amalite mgbe ha ruru afọ iri na ise ma ọ bụ karịa. Otu akwụkwọ kwuru na oge mgbanwe ahụ na-amalite na-adịgasị iche iche.

Mgbanwe ahụ nwere ike ime ka ọ na-echegbu onwe ya. Ndị nọ́ n’oge uto na-echekarị gbasara otú ndị ọzọ ga-esi na-ele ha anya. Otu nwatakịrị aha ya bụ Emeka * kwuru na ihe banyere otú ahụ́ ya dị na otú o sizi akpa àgwà nọ́ na-eche ya uche. O kwukwara na ya na-echekarị na ndị ọzọ na-ewere ya ka onye gbapụrụ iche. Mgbanwe ndị ahụ na-eme ihere, ma, ihere ahụ na-akadị njọ ma ihe tokasịwa onye ahụ n’ihu. Otu nwatakịrị nwaanyị dị́ afọ iri na asaa aha ya bụ Ngozi kwuru na ya chere na ihu ya agbachaala ọkụ. O kwukwara na ya na-ebekarị ákwá ma na-agwa onwe ya na ya ajọọla njọ.

Ọ naghị adịrị ndị nke ha bidoro ngwa ngwa mfe. Ọ bụ ụmụ nwaanyị ka ọ na-akacha enye nsogbu n’obi. E nwere ike ịna-ama ha njakịrị na ha akpụwala ara ma ọ bụkwanụ na ha aghọọla agbọghọ n’ike. Otu akwụkwọ e dere maka ndị nne na nna kwuru na ọ bụ ụdị mgbanwe a na-eme ka ụmụ okorobịa chọwa imebi ha.

Ọ pụtaghị na ọ marala ihe. Ilu 22:15 kwuru na ọ bụ “nzuzu ka e kekọtara ya na obi nwata.” Mgbanwe ndị ahụ agaghị agbanwe àgwà ya. O nwere ike ịdị gị ka nwa gị ò toola. Ma, otu akwụkwọ kwuru na uto ahụ abụghị ya ga-eme ka ọ mụta ime mkpebi dị́ mma, kpawa àgwà ọma, mụta ịna-ejide onwe ya, ma ọ bụkwanụ kpawa àgwà ndị ọzọ e ji ama na mmadụ etoola.

IHE I NWERE IKE IME

Gwa ya gbasara ya tupu nke ya amalite. Nyere nwa gị aka ka ọ ghọta ihe ọ na-aga ịhụ. Otu ihe dị́ mkpa ị ga-akọwara nwa gị nwaanyị bụ gbasara nwaanyị ịhụ nsọ ya. Ị ga-akọwakwara nwa gị nwoke gbasara ọbara ọcha na-agbapụta ụmụ nwoke n’ahụ́. Ihe abụọ a adịghị ka mgbanwe ndị nke ọzọ, ha na-amalite na mberede. Ha nwere ike ịgbagwoju nwa gị anya, meekwa ka obi wụnye ya n’afọ. Ị kọwawara ya ihe ndị a, mee ka ọ ghọta na mgbanwe ndị ahụ bara uru, na ha bụ ihe na-egosi na mmadụ etowela.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Abụ Ọma 139:14.

Ezorola ya ihe ọ bụla. Otu nwa okorobịa aha ya bụ Okorie kwuru na papa ya na mama ya zochiiri ya ihe ụfọdụ mgbe ha na-akọrọ ya gbasara mgbanwe ndị ọ ga-ahụ n’ahụ́ ya. O kwukwara na ha gaara aka enyere ya aka ma a sị na ha kpọọrọ ya okwu aha. Otu nwa agbọghọ dị́ afọ iri na asaa aha ya bụ Adanna kwukwara ihe yiri ihe a Okorie kwuru. Ọ sịrị na mama ya kọọrọ ya gbasara mgbanwe ndị ahụ, kwuokwa na mama ya gaara akọwara ya ihe niile iji nyere ya aka. Okwu gbasara mgbanwe ndị a anaghị adị mfe okwukwu, ma, gbalịa kọwaara nwa gị ihe niile dị́ na ya.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ọrụ Ndịozi 20:20.

Jụọ ya ajụjụ ga-eme ka o kwuo obi ya. Jiri aka gị kwulite okwu gbasara mgbanwe ndị ọzọ hụrụ n’ahụ́ ha. Dị ka ihe atụ, i nwere ike ịjụ nwa gị nwaanyị sị: “Ò nweela nwa klas unu kwutere okwu gbasara ịhụ nsọ ya?” “Ụmụ akwụkwọ unu hà na-achị ụmụ nwaanyị ndị mgbanwe nke ha bidoro ngwa ngwa ọchị?” I nwere ike ịjụ nwa gị nwoke, sị: “Ụmụ akwụkwọ unu hà na-achị ụmụaka ibe ha yiri ka ha anaghị eto eto ọchị?” Ọ bụrụ na i si otú a mee ka nwa gị bido ịkọrọ gị gbasara ndị ọzọ, ọ ga-adịziri ya mfe ịkọrọ gị gbasara onwe ya. Ọ kọwara gị ya, gbaa mbọ ka ị bụrụ “onye na-anụ ihe ngwa ngwa, onye na-adịghị ekwu okwu ngwa ngwa.”—Jems 1:19.

Nyere nwa gị aka ka o nwee “ezi amamihe na ikike iche echiche.” (Ilu 3:21) Ọ bụghị naanị ahụ́ mmadụ na otú obi na-adị ya na-agbanwe ma o tolitewe. Mgbanwe ndị ahụ nwa gị ga-enwe ga-enyekwara ya aka ịma otú ọ ga-esi na-eme mkpebi ndị bara uru ma o too. N’ihi ya, i kwesịrị iji oge ahụ nyere ya aka ka ọ mụta ịna-eme ihe dị́ mma.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ndị Hibru 5:14.

Ike agwụla gị. Ọtụtụ ndị na-eto eto anaghị emepeli ọnụ agwa papa ha ma ọ bụ mama ha gbasara mgbanwe ndị ha na-ahụ n’ahụ́ ha. Ma, echekwala na ikwu gbasara ya agaghị amasị ha. Otu akwụkwọ kwuru na ihe niile nne na nna na-agwa nwa ha nwere ike na-aba nwa ahụ n’isi, ma, ya ana-eme ka à ga-asị na ọ naghị aghọta ihe ahụ a na-agwa ya.

^ para. 8 Aha a kpọrọ ndị mmadụ n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.