Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AJỤJỤ ỌNỤ | PAOLA CHIOZZI

Ihe Onye Mụrụ Banyere Ihe Ndị Dị Ndụ Kwuru Gbasara Chineke

Ihe Onye Mụrụ Banyere Ihe Ndị Dị Ndụ Kwuru Gbasara Chineke

Paola Chiozzi bụ ọkà mmụta n’ihe gbasara ihe ndị dị ndụ. Ọ na-arụ na mahadum Ferara dị n’Ịtali, ọ karịakwala afọ iri abụọ ọ rụwara ọrụ a. N’isiokwu a, ị ga-ahụ ihe ndị na-ede Teta! jụrụ ya gbasara sayensị na Chineke, hụkwa ihe ọ sara ha.

Gịnị ka ị ga-achọ ịgwa anyị gbasara onwe gị?

Papa m na mama m anwụọla. Ma, mgbe ha nọ ndụ, ọrụ papa m bụ imeziri ndị mmadụ akpụkpọ ụkwụ, nke mama m abụrụ ọrụ ugbo. N’oge ahụ, achọrọ m ịbụ ọkà mmụta sayensị. Mgbe ọ bụla m hụrụ okooko osisi, obi ana-atọ m ụtọ. Otú ahụkwa ka ọ na-adị m ma m hụ ụmụ nnụnụ na ụmụ ahụhụ. O doro m anya na ọ bụghị mmadụ kere ha.

Ihe ị na-ekwu ọ̀ bụ na i kweere na Chineke kemgbe ị dị obere?

Mba. Ọ bụdị mgbe ahụ m dị obere ka m bidoro nwewe obi abụọ ma Chineke ọ̀ dị. Papa m nọkatara otu ụbọchị obi akụchie ya, ya anwụọ. Ihe a mere ya mere ka m chewe ihe mere Onye a kere ọmarịcha ihe a niile ji gba nkịtị ka ụmụ mmadụ na-ata ahụhụ, na-anwụsị.

Sayensị ò merenụ ka ị mata ihe kpatara ya?

O meghị. Mgbe m malitere ịmụ gbasara mkpụrụ ndụ, achọpụtara m na mkpụrụ ndụ dị anyị n’ahụ́ na-eme nke oge ya ruru, ya anwụọ, nke ọhụrụ anọchie ya. Ya nwee onye nke ya nwụrụ mgbe oge ya erubeghị, ya akpatara ya etuto ma ọ bụkwanụ ahụ́ ya ana-aba ọnyá. O tebeghị anya ndị ọkà mmụta sayensị chọpụtara ihe a. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na ịma gbasara ya dị ezigbote mkpa.

Olee ihe mere i ji sị na ọ dị ezigbote mkpa?

Mkpụrụ ndụ dị n’ahụ́ anyị dị nde kwuru nde, o nweghịkwa nke n’ime ha anyị na-ahụ anya. Mee elu mee ala, ha niile ga-anwụcha, ndị ọzọ anọchie ha. Mkpụrụ ndụ nke ọ bụla nwere mgbe ọ ga-anọru, ya anwụọ. O nwere ndị nke na-anọ izu ole na ole, nwekwa ndị nke na-anọ afọ ole na ole. Ọ bụrụ na ahụ́ anyị anaghị arụ ọrụ nke ọma otú o kwesịrị, mkpụrụ ndụ ndị dị anyị n’ahụ́ nwere ike nwụsịchaa mgbe oge ha erubeghị. O nwekwara ike mee ka a ghara inwe mkpụrụ ndụ ọhụrụ ga-anọchi ndị nke nwụrụ anwụ.

Ya dị otú ahụ, gịnị nwere ike ime?

Ndị ọkachamara achọpụtala na ọ bụrụ na mkpụrụ ndụ ndị dị mmadụ n’ahụ́ anọfee mgbe ha kwesịrị ịnwụ, ọrịa kansa ma ọ bụ ogbu na nkwonkwo nwere ike malite inye onye ahụ nsogbu. Ha chọpụtakwara na ọ bụrụ na ha anọrughị mgbe ha kwesịrị ịnwụ, ụkwụ na aka nwere ike malite ịna-ama onye ahụ jijiji ma ọ bụkwanụ ụbụrụ agaghịzi na-akpakọ ya ọnụ. Ọrụ m bụ ịchọpụta otú e nwere ike isi gwọọ onye na-arịa ọrịa ndị a.

Ihe ị chọpụtara gbasara mkpụrụ ndụ ò nwere ihe ọ kụziiri gị?

Ịgwa gị eziokwu, ọ gbagwojuru m anya. I lee otú ihe niile dị n’ahụ́ mmadụ sị na-arụ ọrụ nke ọma, ị ga-achọpụta na onye kere anyị chọrọ ka ahụ́ na-agbasi anyị ike mgbe niile. Ma, ihe m na-amaghịzi bụ ihe mere mmadụ ji na-ata ahụhụ ma na-anwụ ka ọkụkọ.

Ma obi siri gị ike mgbe ahụ na e nwerịrị onye kere mkpụrụ ndụ ma hazie otú ha si na-arụ ọrụ, ọ̀ kwa ya?

Ee. Otú o si arụ ọrụ dị egwu, o gosikwara na onye kere ha karịrị mmadụ. Ekwetasiri m ike na ọ bụ Chineke kere ha ma hazie otú ha si arụ ọrụ. Mgbe m ji ọkpọka onyokomita nyoo otú mkpụrụ ndụ dị anyị n’ahụ́ si arụ ọrụ, achọpụtara m na ha na-eji aka ha egbu onwe ha ma oge ha ruo. Otú ihe niile a si aga n’anya ha n’anya ha dị nnọọ egwu.

Ebe ọ bụ na ahụ́ anyị na-eji aka ya ewepụta mkpụrụ ndụ ọhụrụ ndị ga-anọchi ndị nke nwụrụ anwụ, mmadụ kwesịrị ịna-adị ndụ ebighị ebi

I kwuburu na ị maghị ihe mere Chineke ji hapụ ka ụmụ mmadụ na-ata ahụhụ ma na-anwụ. Olee otú i si mechaa mata ihe kpatara ya?

N’afọ 1991, Ndịàmà Jehova abụọ bịara n’ụlọ m, mụ ajụọ ha ihe mere mmadụ ji na-anwụ anwụ. Ha emepee Baịbụl, gụọrọ m Ndị Rom 5:12, bụ́ ebe sịrị: “Mmehie si n’aka otu mmadụ bata n’ụwa, ọnwụ esikwa ná mmehie bata.” A sị na Adam enupụrụghị Chineke isi, ọ garaghị anwụ. Ihe a Baịbụl kwuru mere mụ aghọtakwuo ihe m chọpụtara gbasara mkpụrụ ndụ. Ịgwa gị eziokwu, Chineke ekeghị ụmụ mmadụ ka ha na-anwụ anwụ. Ebe ọ bụ na ahụ́ anyị na-eji aka ya ewepụta mkpụrụ ndụ ọhụrụ ndị ga-anọchi ndị nke nwụrụ anwụ, ị́ hụghị na mmadụ kwesịrị ịna-adị ndụ ebighị ebi?

Gịnị mere i ji kwetasie ike na Baịbụl bụ Okwu Chineke?

O nwere ihe Abụ Ọma 139:16 kwuru gbasara Chineke. Ebe ahụ sịrị: “Anya gị hụrụ m ọbụna mgbe m bụ nwa e bu n’afọ, e dekwara akụkụ ahụ́ m niile n’akwụkwọ gị.” Achọpụtara m na ihe a Baịbụl kwuru bụ eziokwu n’ihi na ọ bụ ná mkpụrụ ndụ dị anyị n’ahụ́ ka Chineke deturu otú akụkụ ahụ́ anyị niile ga-esi na-arụ ọrụ. Ma, ihe juziri m anya bụ otú onye dere Abụ Ọma 139:16 si mara ihe a. Ihe a na ihe ndị ọzọ m gụtara na Baịbụl mere ka m kwetasie ike na Baịbụl bụ Okwu Chineke.

Olee otú i si mechaa matakwuo ihe Baịbụl na-akụzi?

Otu Onyeàmà Jehova gwara m ka mụ na ya mụwa Baịbụl, mụ ekweta. Ka anyị na-amụ ihe, achọpụtara m ihe mere Chineke ji gba nkịtị ka ụmụ mmadụ na-ata ahụhụ. Amụtakwara m na Chineke ga-emecha mee “ka ọnwụ ghara ịdịkwa ruo mgbe ebighị ebi.” (Aịzaya 25:8, Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society) Onye kere anyị ga-eme ka ahụ́ anyị bidoghachi ịrụ ọrụ otú o kwesịrị ịrụ. Mgbe ahụzi ka anyị ga-adị ndụ ebighị ebi n’enweghị nsogbu.

Ò nweela mgbe i ji ihe ndị a ị mụtara na Baịbụl nyere ndị ọzọ aka?

N’afọ 1995, aghọrọ m Onyeàmà Jehova. Kemgbe ahụ, ana m agbalị iji ohere ọ bụla dapụtaranụ gosi ndị mmadụ ihe ndị m mụtara na Baịbụl. Dị ka ihe atụ, o nwere otu nwaanyị mụ na ya na-arụ otu ebe. Nwanne ya nwoke gburu onwe ya. Ndị chọọchị nwaanyị a gwara ya na Chineke emekataghị gbaghara onye gburu onwe ya. M sapetara Baịbụl gụọrọ ya nkwa Chineke kwere na ya ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ. (Jọn 5:28, 29) Ihe ahụ m gụụrụ ya medara ya obi, meekwa ka ọ ghọta na ihe banyere anyị na-emetụ onye kere anyị n’obi. Mgbe ọ bụla m kọọrọ mmadụ ihe Baịbụl kwuru, obi na-atọ m ezigbo ụtọ karịa otú ọ na-atọ m ma ọ bụrụ ihe gbasara sayensị ka m kọọrọ onye ahụ.