Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Ka M Ga-atụ Anya Ya Ma M Lụọ Di Ma Ọ Bụ Nwaanyị?—Nkebi nke Mbụ

Gịnị Ka M Ga-atụ Anya Ya Ma M Lụọ Di Ma Ọ Bụ Nwaanyị?—Nkebi nke Mbụ

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị

Gịnị Ka M Ga-atụ Anya Ya Ma M Lụọ Di Ma Ọ Bụ Nwaanyị?​—Nkebi nke Mbụ

“Obi na-adị m ezigbo ụtọ ma mụ na ya nọrọ, ọ dị m ka anyị lụọ taa na echi.”

“Ihe anaghị adabara mụ na ya. Anyị anaghị ebi ka di na nwunye. Eyiri m onye na-enweghị di.”

Ị̀ MA na ọ bụ otu onye kwuru ihe abụọ ahụ? O kwuru nke ahụ dị n’elu mgbe ya na otu nwa okorobịa na-akpa, kwuo nke ahụ dị n’ala mgbe nwa okorobịa ahụ lụrụ ya ya na ya ebiri.

Olee ebe mmiri si baa n’opi ụgbọgụrụ? Ọ bụrụ na ị ma na ị ga-alụ di ma ọ bụ nwaanyị, gịnị ka ị ga-eme ka obi ụtọ ị na-atụ anya inwe ghara ịkwa gị?

Ihe i kwesịrị ịma: Ihe ị na-atụ anya ya ma ị lụọ di ma ọ bụ nwaanyị nwere ike ikpebi ma ị̀ ga-enwe obi ụtọ.

Nkebi nke a na nkebi nke abụọ anyị ga-ebipụta ga-enyere gị aka ịma ihe i kwesịrị ịna-atụ anya ya ma ị lụọ di ma ọ bụ nwaanyị.

Olee ihe ndị i kwesịrị ịna-atụ anya ya ma ị lụọ di ma ọ bụ nwaanyị? Lee atọ n’ime ha:

(1) Tụwa anya uru ndị ị ga-erite

(2) Tụwa anya nsogbu ụfọdụ unu ga-enwe

(3) Tụwa anya ihe ụfọdụ ị na-ebughị n’obi na ha ga-eme

Ka anyị tụlee ihe atọ a.

TỤWA ANYA URU NDỊ Ị GA-ERITE

Baịbụl gosiri na ịlụ di ma ọ bụ nwaanyị abụghị ihe ọjọọ. (Ilu 18:22) Ka anyị tụlee uru ụfọdụ ọ bara.

Ị ga-enwe onye gị na ya ga na-anọ. Baịbụl kwuru na mgbe Chineke kechara Adam, o nwere mgbe o ruru ya ekwuo na ‘ọ dịghị mma ka ọ nọgide naanị ya.’ Mgbe o kwuchara ihe a, o kere Iv ka ya na Adam biri. (Jenesis 2:18) Chineke kere onye nke ọ bụla n’ime ha ka o nwee àgwà nke ya. E nwere àgwà ụfọdụ Adam nwere Iv na-enweghị, nweekwa ndị nke Iv nwere Adam na-enweghị. Ma, ha abụọ ga-ebili n’udo. Ọ bụ ihe a mere nwoke na nwaanyị ji ebili n’ụlọ.—Ilu 5:18.

Ị ga-enwe onye gị na ya ga na-emekọ ihe ọnụ. Baịbụl sịrị: “Mmadụ abụọ nọ na-arụkọ ọrụ dị mma n’ihi na ha ga-arụpụta karịa ihe otu onye ga-arụpụta.” (Ekliziastis 4:9, Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society) Ihe a Baịbụl kwuru gbasakwara di na nwunye. Otu nwaanyị aha ya bụ Nnenna, * onye lụrụ di n’oge na-adibeghị anya kwuru, sị: “Ihe na-eme ka di na nwunye na-enwe obi ụtọ bụ imekọ ihe ọnụ, ịdị obi umeala, na onye ọ bụla n’ime ha ikwere ihe ibe ya kwuru.”

Ị ga-enwe onye gị na ya ga na-enwe mmekọahụ. Baịbụl kwuru, sị: “Ka di ọ bụla jisi ike na-akwụ nwunye ya ụgwọ mmekọ o ji ya. Otu aka ahụ, ka nwunye jisi ike na-akwụ di ya ụgwọ mmekọ o ji ya.” (1 Ndị Kọrịnt 7:3, Bible Nsọ Ọhụụ) Ọ bụrụ na ị lụọ di ma ọ bụ nwaanyị, gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị ga na-enwe mmekọahụ. Obi agaghị ekoro gị n’elu otú ọ na-ekoro ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọbịa ndị na-alụghị di na nwunye ma na-enwe mmekọahụ.—Ilu 7:22, 23; 1 Ndị Kọrịnt 7:8, 9.

Ihe anyị na-ekwu bụ: Ịlụ di ma ọ bụ nwaanyị bụ onyinye si n’aka Chineke. (Jems 1:17) Ọ bụrụ na ị na-eme ihe Chineke kwuru, obi ga-adị gị ụtọ ma ị lụọ di ma ọ bụ nwaanyị.

Ajụjụ ndị ị ga-echebara echiche: Otú mama gị na papa gị ma ọ bụ di na nwunye ọzọ ị hụrụla si ebi ò meela ka ị na-eche na ọ ka mma ka mmadụ ghara ịlụ di ma ọ bụ nwaanyị? Ya bụrụ otú ahụ, ò nwere ndị di na nwunye na-ebi n’udo ị ga-achọ ịdị ka ha?

TỤWA ANYA NSOGBU ỤFỌDỤ UNU GA-ENWE

Baịbụl kwuru na ndị lụrụ di na nwaanyị ga-enwe nsogbu mgbe ụfọdụ. (1 Ndị Kọrịnt 7:28) Lee nsogbu ụfọdụ i nwere ike ịtụ anya ya.

Unu nwere ike ise okwu mgbe ụfọdụ. O nweghị mmadụ zuru okè. (Ndị Rom 3:23) N’ihi ya, di na nwunye nwere ike ise okwu mgbe ụfọdụ n’agbanyeghị na ha hụrụ ibe ha n’anya. Mgbe ụfọdụ, ha nwere ike ikwu ihe ha ga-emecha kwaara m̀ makwaara. Baịbụl kwuru, sị: “Onye ọ bụla nke na-adịghị emehie site n’ikwuhie ọnụ bụ onye tozuru oke.” (Jems 3:2, Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society) Ọ na-abụ di na nwunye na-ebi n’udo chọpụta ihe nwere ike isere ha okwu, ha anaghị agbachi nkịtị. Ha na-ekwurịta ya ma dozie ya. Nke a na-emekwa ka ha nwee obi ụtọ.

Ị ga-ahụ ihe ndị ị na-atụghị anya ha. Otu nwa agbọghọbịa aha ya bụ Njideka kwuru, sị: “Ihe a na-egosikarị na fim nakwa na tiivi bụ otú nwa agbọghọ si hụ nwoke bụ́ obi ya, ha abụọ alụọ ma biri n’udo.” Ọ bụrụ na nwoke na nwaanyị alụọ mechaa chọpụta na ihe ahụ a na-egosi na fim nakwa na tiivi abụghị otú ụwa dị, obi nwere ike ịgbawa ha. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụrụ na nwoke na nwaanyị alụọ, ha ga-emecha chọpụta àgwà ụfọdụ na-adịghị mma ibe ha na-akpa. Ma, ihe ga-enyere ha aka bụ icheta na ezigbo ịhụnanya “na-edi ihe niile,” ma ihe ndị a na-atụghị anya ha.—1 Ndị Kọrịnt 13:4, 7.

Ị ga na-echegbu onwe gị. Baịbụl kwuru na onye lụrụ di ma ọ bụ nwaanyị “na-echegbu onwe ya maka ihe nke ụwa.” (1 Ndị Kọrịnt 7:33, 34) Ọ bụghị mgbe niile ka iche maka ihe nke ụwa dị njọ. Dị ka ihe atụ, e nwere ike ị gaghị enwecha ego ị ga-eji kwụọ ụgwọ ihe ụfọdụ. Gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị nwere ike ịna-arụ ọrụ ka unu nwee ike inweta nri na uwe, ma na-akwụ ụgwọ ụlọ. Ma, ọ bụrụ na unu ejiri otu obi, unu ga-egboli mkpa ezinụlọ unu.—1 Timoti 5:8.

Ihe anyị na-ekwu bụ: Ebe ọ bụ na mgbe nwoke na nwaanyị na-akpa, ha na-agba mbọ dozie nsogbu ọ bụla ha nwere, ha lụọ, ha kwesịrị ịgbasikwu mbọ ike na-edozi nghọtahie ọ bụla ha nwere. Ma, Jehova ga-enyere ha aka idozi ya.

Ajụjụ ndị ị ga-echebara echiche: Gị na papa gị ma ọ bụ mama gị ma ọ bụ nwanne gị nwee nghọtahie, olee ihe ị na-eme ka unu nwee ike idozi ya? Ọ bụrụ na mmadụ emee ihe ị na-atụghị anya na ọ ga-eme gị, ị̀ na-agbaghara ya? Gịnị ka ị na-eme ma e nwee ihe na-echegbu gị?

NÁ NKEBI NKE ABỤỌ, ANYỊ GA-AZA AJỤJỤ BỤ́ . . . Olee otú Baịbụl ga-esi nyere gị aka ịtụ anya ihe ụfọdụ ị na-ebughị n’obi na ha ga-eme?

Ị gaa n’adres Ịntanet anyị bụ́ www.pr418.com ị ga-ahụ ihe ndị ọzọ a tụlerela n’isiokwu a bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị”

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 17 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 29]

IHE NDỊ NA-ETO ETO IBE GỊ KWURU

Brittany—Mmadụ ekwesịghị ịga lụọ di maka na ndị mmadụ na-ajụkarị ya mgbe ọ ga alụ di. Ọ bụrụ na nsogbu apụta, ọ bụ onye ahụ ga-ebu ya, ọ bụghị ndị ahụ chọrọ ka ọ lụọ di taa na echi.

Ciara—Ọ bụrụ na mmadụ erie gị obi, o nwere ike ime ka ị ghara ichebara onwe gị echiche mara ma ọ̀ bụ onye i kwesịrị ịlụ. Ọ bụ ihe mere m ji chee na papa gị na mama gị kwesịrị inyere gị aka mgbe ị na-ekpebi onye ị ga-alụ. Ha maruru gị ala, ha ga-enyeliri gị aka ịhọta onye dị mma.

[Igbe dị na peeji nke 30]

GỊNỊ KA I CHERE?

Chibuike na Chioma nọ na-akpa kemgbe otu afọ. Ma, n’ime otu afọ a ha kparala, ọ fọrọ obere ka ha tisaa ugboro abụọ. Nke mbụ bụ mgbe Chibuike gwara Chioma na ọ na-achụ ụmụ nwoke ma sị ya na nke ha ga-ebi ma ọ bụrụ na ọ kwụsịghị ya. Nke abụọ bụ mgbe Chioma gwara Chibuike na ya chọrọ ka onye ọ bụla nọọrọ onwe ya n’ihi na ike ebubo ya agwụla ya. Ma, ha kpeziri ugboro abụọ ahụ ha sere okwu.

Gịnị ka i chere? Ò nwere ihe ị hụrụ gosiri na mmadụ abụọ a ga-enwe nsogbu ma ha lụọ? Gịnị ka otú ahụ Chibuike na Chioma gaara esi tisaa ugboro abụọ na-egosi? Ma, olee ihe ị mụtara n’otú ahụ ha si dozie nsogbu ha? Gịnị ka ha nwere ike ịtụ anya ya ma ha lụọ?

[Igbe dị na peeji nke 30]

IHE GỊ NA NDỊ MỤRỤ GỊ NWERE IKE ỊKPA

Gakwuru papa gị na mama gị, jụọ ha ihe ha chere gbasara ajụjụ ndị ahụ dị n’ebe e dere “Gịnị Ka I Chere?” Ihe ha kwuru banyere Chibuike na Chioma ọ̀ dị iche n’ihe i chere banyere ha?