Job 1:1-22

  • Job bara ọgaranya, na-akwụwa aka ọtọ (1-5)

  • Setan kwuru na ọ bụghị n’efu ka Job na-atụ egwu Chineke (6-12)

  • Akụnụba Job lara n’iyi, ụmụ ya anwụọkwa (13-19)

  • ob ataghị Chineke ụta (20-22)

1  E nwere otu nwoke bi n’ala Ọz. Aha ya bụ Job.*+ Ọ bụ onye ezi omume nke na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta.*+ Ọ na-atụ egwu Chineke, ọ naghịkwa etinye aka n’ihe ọjọọ.+  A mụụrụ ya ụmụ nwoke asaa na ụmụ nwaanyị atọ.  Anụ ụlọ ya dị puku atụrụ asaa (7,000), puku kamel atọ (3,000), otu puku ehi (1,000),* na narị jakị* ise (500). O nwekwara ọtụtụ ndị na-ejere ya ozi. Ọ bụ ya mere o ji bụrụ ya kacha baa ọgaranya ná ndị niile bi n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ.  Nwa ya nwoke nke ọ bụla na-eme oriri n’ụlọ ya n’ụbọchị nke ya.* Ha na-akpọ ụmụnne ha ndị nwaanyị atọ ka ha bịa soro ha rie ma ṅụọ.  Mgbe ha niile n’otu n’otu mechara oriri n’ụlọ ha, Job na-ezi ozi ka ha bịa ka o mee ka ha dị nsọ. Ọ na-ebili n’isi ụtụtụ chụọrọ onye nke ọ bụla n’ime ha àjà a na-esu ọkụ.+ N’ihi na, Job na-asị: “O nwere ike ịbụ na ụmụ m emehiela ma kwujọọ Chineke n’obi ha.” Ọ bụ ihe Job na-eme mgbe niile.+  Otu ụbọchị, ụmụ ezi Chineke*+ bịara ka ha guzo n’ihu Jehova,+ Setan+ bịakwara soro ha.+  Jehova wee sị Setan: “Olee ebe i si bịa?” Setan zara Jehova, sị: “M nọ na-akpagharị n’ụwa, na-agagharịkwa n’ime ya.”+  Jehova wee sị Setan: “Ì leruola ohu m Job anya?* Ị̀ hụla na e nweghị onye dị ka ya n’ụwa? Ọ bụ onye ezi omume nke na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta.*+ Ọ na-atụ egwu Chineke, ọ naghịkwa etinye aka n’ihe ọjọọ.”  Setan wee sị Jehova: “Ọ̀ bụ n’efu ka Job na-atụ egwu Chineke?+ 10  Ọ̀ bụ na ị naghị echebe ya+ na ụlọ ya na ihe niile o nwere?* Ị gọziela ọrụ niile ọ na-arụ,+ meekwa ka anụ ụlọ ya ju ebe niile. 11  Ma, ọ bụrụ na ị ga-amatị aka gị ugbu a napụ ya ihe niile o nwere, ọ ga-ekwujọ gị n’ihu gị.” 12  Jehova sịziri Setan: “Lee, ihe niile o nwere dị gị n’aka. Ma, emetụla yanwa aka.” Setan wee si n’ihu Jehova pụọ.+ 13  Otu ụbọchị, mgbe ụmụ ya ndị nwoke na ụmụ ya ndị nwaanyị nọ na-eri ihe ma na-aṅụ mmanya n’ụlọ nwanne ha nke diọkpara,+ 14  otu onye ozi bịakwutere Job, sị: “Ìgwè ehi gị nọ na-akọ ihe, ìgwè jakị gị nọkwa na-ata ahịhịa n’akụkụ ha 15  mgbe ndị Siba bịara lụso anyị ọgụ ma chịkọrọ ha, ha jikwa mma agha gbuo ndị na-ejere gị ozi. Ọ bụ naanị m gbapụtara ka m kọọrọ gị ihe merenụ.” 16  Mgbe ọ ka kpụ okwu n’ọnụ, onye ọzọ bịara, sị: “Ọkụ nke si n’aka Chineke* si n’eluigwe daa ree ìgwè atụrụ gị na ndị na-ejere gị ozi ma regbuo ha. Ọ bụ naanị m gbapụtara ka m kọọrọ gị ihe merenụ.” 17  Mgbe ọ ka kpụ okwu n’ọnụ, onye ọzọ bịara, sị: “Ndị Kaldia+ kere onwe ha ụzọ atọ bịa chịkọrọ kamel gị, ha jikwa mma agha gbuo ndị na-ejere gị ozi. Ọ bụ naanị m gbapụtara ka m kọọrọ gị ihe merenụ.” 18  Mgbe ọ ka kpụ okwu n’ọnụ, onye ọzọ bịakwara, sị: “Ụmụ gị ndị nwoke na ụmụ gị ndị nwaanyị nọ na-eri ihe ma na-aṅụ mmanya n’ụlọ nwanne ha nke diọkpara. 19  Ma, oké ifufe si n’ala ịkpa fee na mberede. O fesiri ike n’ụlọ ahụ, ụlọ ahụ wee daa dagbuo ụmụ gị. Ọ bụ naanị m gbapụtara ka m kọọrọ gị ihe merenụ.” 20  Job wee bilie dọwaa uwe ya, kpụọkwa isi ya. O gburu ikpere n’ala kpọọ isiala, 21  sị: “Agba m aka* si n’afọ nne m pụta,M ga-agbakwa aka* laghachi.+ Ọ bụ Jehova nyere,+ ọ bụkwa Jehova weere. Ka a na-eto aha Jehova.” 22  N’ihe niile a, Job emehieghị, o kwughịkwa na Chineke mere ihe na-adịghị mma.*

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “nke kwụsiri ike n’ebe Chineke nọ.”
O nwere ike ịbụ na Job pụtara “Onye A Kpọrọ Asị.”
Na Hibru, “ehi abụọ abụọ dị ụzọ narị ise.”
Na Hibru, “nne jakị.”
Ma ọ bụ “n’ụlọ onye nke ọ bụla o ruuru.”
Ihe a bụ akpaala okwu Hibru nke pụtara ụmụ Chineke bụ́ ndị mmụọ ozi.
Na Hibru, “Ì tinyela obi gị n’ebe ohu m Job nọ?”
Ma ọ bụ “nke kwụsiri ike n’ebe Chineke nọ.”
Na Hibru, “Ọ̀ bụ na ị gbaghị ya na ụlọ ya na ihe niile o nwere ogige?”
O nwere ike ịbụ, “Àmụ̀mà.”
Na Hibru, “ọtọ.”
Na Hibru, “ọtọ.”
Ma ọ bụ “o kwujọghịkwa Chineke.”