Akwụkwọ Ozi Mbụ E Degaara Ndị kọrịnt 1:1-31

  • Ekele (1-3)

  • Pọl kelere Chineke maka ndị Kọrịnt (4-9)

  • Pọl gbara ndị Kọrịnt ume ka ha dịrị n’otu (10-17)

  • Kraịst gosiri ike na amamihe Chineke (18-25)

  • Jiri naanị Jehova na-anya isi (26-31)

1  Ọ bụ Pọl, onye Kraịst Jizọs kpọrọ ka ọ bụrụ onyeozi+ otú Chineke si chọọ, na Sọstenis nwanna anyị,  na-edetara ọgbakọ Chineke dị na Kọrịnt akwụkwọ ozi a.+ Chineke doro unu nsọ ka unu bụrụ ndị na-eso ụzọ Kraịst Jizọs.+ Chineke kpọrọ unu ka unu bụrụ ndị dị nsọ, unu na ndị niile nọ ebe ọ bụla na-akpọ aha Onyenwe anyị niile, bụ́ Jizọs Kraịst.+  Ka Chineke Nna anyị nakwa Onyenwe anyị Jizọs Kraịst meere unu amara, meekwa ka udo dịrị unu.  Ana m ekele Chineke maka unu mgbe niile n’ihi amara o si n’aka Kraịst Jizọs meere unu.  Ọ bụ maka na unu na Jizọs dị ná mma mere unu ji nweta ihe niile. Ọ bụ ya mere unu ji nwee ike ịma okwu Chineke nke ọma, nweekwa ike ikwusa ya nke ọma.+  Ozi ọma unu na-ezi banyere Kraịst+ emeela ka unu sie ezigbo ike,  nke na unu nwere onyinye niile, ka unu na-echesi ike ka Onyenwe anyị Jizọs Kraịst gosi ike ya.+  Chineke ga-emekwa ka unu nọsie ike ruo ọgwụgwụ, ka a ghara inwe ihe onye ọ bụla ga-eji maka ya bo unu ebubo n’ụbọchị Onyenwe anyị Jizọs Kraịst ga-abịa.+  Chineke na-emezu ihe o kwuru.+ Ọ bụ ya kpọrọ unu ka unu na Ọkpara ya bụ́ Jizọs Kraịst Onyenwe anyị dịrị ná mma.* 10  Ụmụnna m, m ji aha Onyenwe anyị Jizọs Kraịst na-agba unu ume ka unu niile na-ekwu otu ihe, ka unu gharakwa ịna-akpa iche iche,+ kama ka unu nwee otu obi, ka ihe unu na-eche bụrụkwa otu.+ 11  Ụmụnna m, ndị ụlọ Kloi gwara m banyere unu. Ha kwuru na unu na-ese okwu. 12  Ihe m na-ekwu bụ na olu unu na-ada iche iche. Otu onye na-asị: “Ana m eso ụzọ Pọl,” onye ọzọ ana-asị, “Ana m eso ụzọ Apọlọs,”+ onye ọzọ ana-asị, “Ana m eso ụzọ Sifas,”* onye ọzọ ana-asịkwa, “Ana m eso ụzọ Kraịst.” 13  È kewara Kraịst ekewa? Ọ̀ bụ Pọl ka e gburu n’elu osisi n’ihi unu? Ka è mere unu baptizim n’aha Pọl? 14  Ana m ekele Chineke na o nweghị onye n’ime unu m mere baptizim ma e wezụga Krispọs+ na Gayọs.+ 15  N’ihi ya, o nweghị onye ga-asị na unu mere baptizim n’aha m. 16  Emekwara m ezinụlọ Stefanas baptizim.+ E wezụga ndị a, echetaghị m onye ọzọ m mere baptizim. 17  N’ihi na Kraịst zipụrụ m ka m na-ezisa ozi ọma,+ ọ bụghị ka m na-eme ndị mmadụ baptizim. O zipụghịkwa m ka m na-ekwu okwu ka onye gụrụ oké akwụkwọ,* ka ọnwụ Kraịst nwụrụ n’osisi ịta ahụhụ* ghara ifu ọhịa. 18  N’ihi na okwu gbasara ọnwụ Kraịst nwụrụ n’osisi ịta ahụhụ* bụ okwu nzuzu n’anya ndị a na-aga ibibi ebibi,+ ma n’anya anyịnwa bụ́ ndị a na-aga ịzọpụta, ọ na-egosi ike Chineke.+ 19  N’ihi na e dere, sị: “M ga-eme ka amamihe nke ndị ma ihe laa n’iyi, agaghịkwa m eji amamihe ndị ọkachamara mee ihe ọ bụla.”+ 20  N’oge a,* olee ebe onye amamihe, odeakwụkwọ,* na ọ̀rụ́ ụka nọ? Ọ̀ bụ na Chineke emebeghị ka amamihe ụwa bụrụ ihe nzuzu? 21  Ndị ụwa amaghị Chineke+ n’ihi na ha tụkwasịrị amamihe ha obi.+ Ha weere na ihe anyị na-ekwusa abaghị uru. Ma, Chineke ji ozi a azọpụta ndị nabatara ya.+ E sikwa otú a na-egosi amamihe Chineke. 22  Ndị Juu na-achọ ka a rụọrọ ha ọrụ ebube,+ ndị Grik na-achọkwa amamihe. 23  Ma anyị na-ekwusa gbasara Kraịst, onye e gburu n’elu osisi. Ihe a anyị na-ekwusa na-esiri ndị Juu ike ịnabata. Ndị mba ọzọ wekwaara ya ka ihe nzuzu.+ 24  Ma, ndị Chineke kpọrọ, ma ndị Juu ma ndị Grik, weere Kraịst ka onye e si n’aka ya egosi ike Chineke na amamihe Chineke.+ 25  N’ihi na ihe si n’aka Chineke, nke ụmụ mmadụ weere na ọ maghị ihe, ma ihe karịa ha. Ihe sikwa n’aka Chineke, nke ụmụ mmadụ weere na o sighị ike, siri ike karịa ha.+ 26  Ụmụnna m, mgbe Chineke kpọrọ unu, ndị mmadụ anaghị ele ọtụtụ n’ime unu anya ka ndị ma ihe ma ọ bụ ndị siri ike.+ Ọtụtụ n’ime unu esighịkwa n’ezinụlọ ndị ukwu.+ 27  Ma, Chineke họọrọ ndị ụwa weere na ha amaghị ihe iji menye ndị amamihe ihere. Chineke họkwaara ndị ụwa weere na ha esighị ike iji menye ndị siri ike ihere.+ 28  Chineke họkwaara ndị ụwa weere na ha abaghị uru, ndị ha na-eleda anya, na ndị ha weere na ha adịghị adị. Ọ họọrọ ha iji gosi na ndị ụwa weere na ha bara uru abaghị uru ọ bụla,+ 29  ka onye* ọ bụla wee ghara ịnya isi n’ihu Chineke. 30  Ma, ọ bụ n’ihi ya ka unu na Kraịst Jizọs ji dị n’otu. Ọ bụ Jizọs mere ka anyị mata amamihe na ezi omume Chineke.+ Ọ bụkwa ya mere ka anyị dịrị nsọ.+ Ọnwụ ọ nwụrụ iji gbapụta anyị ga-emekwa ka anyị gharazie ịbụ ndị mmehie.+ 31  Ọ bụ ya mere ihe a e dere ji kwesị ekwesị: “Onye na-anya isi, ya jiri Jehova* nyaa isi.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “na-arụkọ ọrụ.”
Aha ya ọzọ bụ Pita.
Ma ọ bụ “onye oké amamihe.”
Gụọ Nkọwa Okwu, “Oge a.”
Ya bụ, onye ma Iwu Mosis nke ọma.
Na Grik, “anụ ahụ́.”
Gụọ A5.