Gaa n'Isiokwu

Ò Nwere Mgbe Nsogbu Ụwa A Ga-akwụsị?

Ò Nwere Mgbe Nsogbu Ụwa A Ga-akwụsị?

Gịnị ka i chere?

  • Ee, ọ ga-akwụsị.

  • Ee e, ọ gaghị akwụsị.

  • O nwere ike ịkwụsị.

GỊNỊ KA BAỊBỤL KWURU?

‘Chineke ga-ehichapụ anya mmiri niile dị ụmụ mmadụ n’anya. Ọnwụ agaghịzi adị. Iru uju ma ọ bụ ibe ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịzi adị.’—Mkpughe 21:3, 4.

OLEE URU Ọ GA-ABARA GỊ?

Obi ga-esi gị ike na ọ bụghị Chineke na-akpatara ụmụ mmadụ nsogbu —Jems 1:13.

Ị ga-amata na ahụhụ anyị na-ata na-emetụ Chineke n’obi.—Zekaraya 2:8.

Ị ga-enwe nchekwube na nsogbu uwa a ga-emecha kwụsị.—Abụ Ọma 37:9-11.

Ì KWESỊRỊ IKWERE IHE A BAỊBỤL KWURU?

Ee. Lee ihe abụọ mere anyị ji kwuo otú ahụ:

  • Nsogbu ụwa a adịghị Chineke mma n’obi, ọ kpọkwara ikpe na-ezighị ezi asị. O nwere mgbe a nọ na-echi ndị na-efe Chineke n’oge ochie ọnụ n’ala. Ndị Ikpe 2:18 kwuru na ndị na-echi ha ọnụ n’ala na-eme ka ha na-asụ ude. Amaokwu Baịbụl ahụ kwukwara na ude ndị Chineke na-asụ n’oge ahụ wutere Jehova.

    Obi anaghị adị Chineke mma ma ọ hụ ndị na-emegbu mmadụ ibe ha. Dị ka ihe atụ, Baịbụl kwuru na Chineke kpọrọ “igbu onye aka ya dị ọcha” asị.—Ilu 6:16, 17.

  • Ihe gbasara onye ọ bụla n’ime anyị na-emetụ Chineke n’obi. Onye ọ bụla n’ime anyị ma “ihe bụ́ nsogbu ya na ahụhụ ọ na-ata.” Jehova makwa ihe ndị ahụ bụ́ nsogbu anyị.2 Ihe E Mere 6:29, 30.

    N’oge na-adịghị anya, Jehova ga-eweta Alaeze ya n’ụwa. Mgbe ahụ, nsogbu niile onye ọ bụla n’ime anyị nwere ga-akwụsị. (Matiu 6:9, 10) Ma ihe Jehova ka na-emegodị ugbu a bụ iji Baịbụl na-akasi ndị niile na-efe ya obi.—Ọrụ Ndịozi 17:27; 2 Ndị Kọrịnt 1:3, 4.

IHE Ị GA-ECHEBARA ECHICHE

Gịnị mere Chineke ji hapụ ụmụ mmadụ ka ha na-ata ahụhụ?

Ị gụọ NDỊ ROM 5:12 na 2 PITA 3:9, ị ga-amata azịza ya.