Gaa n'Isiokwu

Ònyedị Na-achị Ụwa A?

Ònyedị Na-achị Ụwa A?

Ị̀ ga-asị na ọ bụ . . .

  • Chineke?

  • ụmụ mmadụ?

  • Ekwensu?

GỊNỊ KA BAỊBỤL KWURU?

“Ụwa niile dị n’aka ajọ onye ahụ.”—1 Jọn 5:19.

‘Ọkpara Chineke ga-ebibi ọrụ Ekwensu.’—1 Jọn 3:8.

OLEE URU Ọ GA-ABARA GỊ?

Ị ga-aghọta ihe mere imi na anya ji dị ụwa otú a ọ dị ya.—Mkpughe 12:12.

Ị ga-ama na ụwa anyị a ga-emecha dị mma.—1 Jọn 2:17.

Ì KWESỊRỊ IKWERE IHE A BAỊBỤL KWURU?

Ee. Lee ihe atọ mere anyị ji kwuo otú ahụ:

  • Ọchịchị Ekwensu ga-akụ afọ n’ala. Jehova ekwuola na ya ga-emerịrị ka Ekwensu kwụsị ịchị ụmụ mmadụ. Ná Ndị Hibru 2:14, Chineke kwuru na ya ‘ga-ebibi’ Ekwensu, meziekwa ihe niile o mebiri.

  • Chineke echiela Jizọs Kraịst eze ga-achị ụwa. Ekwensu na-eche naanị gbasara onwe ya, ọ na-echikwa ụmụ mmadụ ọnụ n’ala. Ma, Jizọs dị iche, ọ gaghịkwa emekata mee ka ya. Chineke gwara anyị otú Jizọs ga-esi achị ụmụ mmadụ. Ọ sịrị: “[Jizọs] ga-emere ogbenye na onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya ebere . . . Ọ ga-anapụta ha n’aka ndị na-emegbu ha nakwa n’aka ndị na-emesi ha ike.”—Abụ Ọma 72:13, 14.

  • Chineke anaghị agha ụgha. Baịbụl kwuru hoo haa na Chineke bụ “onye na-enweghị ike ịgha ụgha.” (Taịtọs 1:2) Ihe ọ bụla Jehova kwuru na ya ga-eme, ọ ga-emerịrị ya. (Aịzaya 55:10, 11) Jọn 12:31 kwuru, sị: “A ga-achụpụ onye na-achị ụwa a.”

IHE Ị GA-ECHEBARA ECHICHE

Olee otú ụwa anyị a ga-adị ma e wepụ Setan?

Ị gụọ ABỤ ỌMA 37:10, 11 na MKPUGHE 21:3, 4, ị ga-amata azịza ya.