‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’

Akwụkwọ a lebara anya n’otú e si malite ọgbakọ Ndị Kraịst n’oge ndịozi Jizọs na otú ihe ndị mere n’oge ahụ na oge anyị a si yie.

Map

Map na-egosi ebe ndị mmadụ na-akpọkarị Ala Nsọ n’oge a, nakwa ebe ndị Pọl onyeozi gara njem ozi ala ọzọ ndị o mere.

Akwụkwọ Ozi Si n’Aka Òtù Na-achị Isi

Gịnị mere obi ga-eji sie anyị ike na Chineke ga na-akwado anyị ka anyị na-agbalị ike anyị “n’ịgba àmà nke ọma banyere Alaeze Chineke”?

ISI NKE MBỤ

“Gaanụ Mee . . . Ndị Na-eso Ụzọ”

Jizọs buru amụma na a ga-ekwusa ozi ọma Alaeze ahụ n’ụwa niile. Olee otú e si na-eme ya?

ISI NKE ABỤỌ

‘Unu Ga-abụ Ndịàmà M’

Olee otú Jizọs si kwadebe ndịozi ya ka ha nwee ike ibute ụzọ n’ikwusa ozi ọma?

ISI NKE ATỌ

‘Ha Wee Jupụta na Mmụọ Nsọ’

Olee ọrụ mmụọ nsọ Chineke rụrụ ma a bịa n’ịmalite ọgbakọ Ndị Kraịst?

ISI NKE ANỌ

“Ndị Na-agụghị Oké Akwụkwọ na Ndị Nkịtị”

Ndịozi Jizọs mere ihe gosiri na ha adịghị atụ egwu, Jehova gọzikwara ha.

ISI NKE ISE

“Anyị Aghaghị Irubere Chineke Isi Dị Ka Onye Na-achị Achị”

Ndịozi mere ihe ezi Ndị Kraịst taa ga na-elere anya.

ISI NKE ISII

Stivin “Jupụtara n’Amara na Ike”

Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’otú Stivin si gbaa àmà n’atụghị egwu n’ihu ụlọikpe ukwu ndị Juu?

ISI NKE ASAA

Izisa “Ozi Ọma Banyere Jizọs”

E nwere ezigbo ihe anyị ga-amụta n’aka Filip onye na-ezisa ozi ọma.

ISI NKE ASATỌ

Ọgbakọ ahụ “Banyere n’Oge Udo”

Sọl, onye mmegide obi tara mmiri, aghọọ onye ozi ọma na-anụ ọkụ n’obi.

ISI NKE ITOOLU

“Chineke Adịghị Ele Mmadụ Anya n’Ihu”

A malitere ikwusara ndị Jentaịl a na-ebighị úgwù ozi ọma.

ISI NKE IRI

“Okwu Jehova Nọ Na-eto Eto”

A napụtara Pita n’ụlọ mkpọrọ, mkpagbu emeghịkwa ka a kwụsị ikwusa ozi ọma.

ISI NKE IRI NA OTU

Ha ‘Jupụtara n’Ọṅụ na Mmụọ Nsọ’

Pọl kụziiri anyị ihe anyị ga-eme ma anyị hụ ndị mmegide na ndị na-adịghị ege ntị n’ozi ọma.

ISI NKE IRI NA ABỤỌ

Ha “Na-ekwu Okwu n’Atụghị Egwu Site n’Ikike Jehova”

Pọl na Banabas gosiri na ha dị umeala n’obi, bụrụ ndị na-atachi obi, nakwa ndị na-anaghị atụ egwu.

ISI NKE IRI NA ATỌ

‘Ha Nwere Nghọtahie nke Ukwuu’

E buuru esemokwu gbasara ibi úgwù gakwuru òtù na-achị isi.

ISI NKE IRI NA ANỌ

“Anyị Ji Otu Olu Kwekọrịta”

Mụta otú òtù na-achị isi si dozie esemokwu gbasara ibi úgwù nakwa otú nke a si mee ka ọgbakọ niile dị n’udo ma dịrị n’otu.

ISI NKE IRI NA ISE

Ha “Na-ewusi Ọgbakọ Ndị Dị n’Ebe ahụ Ike”

Ndị ozi na-ejegharị ejegharị na-enyere ọgbakọ dị iche iche aka ka okwukwe ha sie ike.

ISI NKE IRI NA ISII

“Gafeta na Masedonia”

Chineke na-agọzi ndị rụrụ ọrụ o nyere ha nakwa ndị ji ọṅụ na-atachi obi mgbe a na-akpagbu ha.

ISI NKE IRI NA ASAA

“Ya na Ha Nọ Na-atụgharị Uche n’Akwụkwọ Nsọ”

Pọl gbaara ndị Juu bi n’obodo Tesalonaịka na Beria àmà nke ọma.

ISI NKE IRI NA ASATỌ

“Chọọ Chineke, . . . ma Chọta Ya n’Ezie”

Pọl ji ihe ya na ndị na-ege ya ntị kweere zie ha ozi ọma, olee otú o si megheere ya ụzọ izi ọtụtụ ndị ozi ọma?

ISI NKE IRI NA ITOOLU

“Na-ekwu Okwu, Agbachikwala Nkịtị”

Gịnị ka anyị na-amụta n’ihe ndị Pọl mere mgbe ọ nọ na Kọrịnt, bụ́ nke ga-enyere anyị aka ịna-agba àmà nke ọma banyere Alaeze Chineke?

ISI NKE IRI ABỤỌ

Okwu Chineke Nọ “Na-agbasa ma Na-enwe Mmeri” n’Agbanyeghị Mmegide

Mụta otú Apọlọs na Pọl si gbaa mbọ hụ na e kwusara ozi ọma ahụ.

ISI NKE IRI ABỤỌ NA OTU

“Aka M Dị Ọcha n’Ebe Ọbara Mmadụ Niile Dị”

Pọl ji ịnụ ọkụ n’obi jee ozi ya, o nyekwara ndị okenye ndụmọdụ.

ISI NKE IRI ABỤỌ NA ABỤỌ

“Ka Uche Jehova Mee”

Pọl gawara Jeruselem n’ihi na ọ chọsiri ike ime uche Chineke.

ISI NKE IRI ABỤỌ NA ATỌ

‘Nụrụnụ Ihe M Na-ekwu Iji Zara Ọnụ M’

Pọl zaara ọnụ ya n’ihu ìgwè mmadụ iwe ji nakwa n’ihu ndị Sanhedrin.

ISI NKE IRI ABỤỌ NA ANỌ

“Nwee Obi Ike!”

A napụtara Pọl mgbe ndị Juu kpara nkata igbu ya, ọ zakwaara ọnụ ya n’ihu Filiks.

ISI NKE IRI ABỤỌ NA ISE

“Ana M Akpọku Siza!”

Pọl gosiri ihe nlereanya n’ịgbachitere ozi ọma.

ISI NKE IRI ABỤỌ NA ISII

“Ọ Dịghị Mkpụrụ Obi Ọ Bụla n’Ime Unu Ga-ala n’Iyi”

Mgbe ụgbọ mmiri Pọl na ndị ọzọ nọ chọrọ ikpu, Pọl gosiri na ya nwere okwukwe dị ukwuu nakwa na ya hụrụ ndị mmadụ n’anya.

ISI NKE IRI ABỤỌ NA ASAA

‘Ịgba Àmà nke Ọma’

A tụrụ Pọl mkpọrọ na Rom, ma ọ nọgidere na-ekwusa ozi ọma.

ISI NKE IRI ABỤỌ NA ASATỌ

‘Ruo n’Ebe Kasị Anya n’Ụwa’

Ndịàmà Jehova ka nọkwa na-arụ ọrụ ahụ ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraịst n’oge mbụ bidoro.

Foto Ndị Dị n’Akwụkwọ A na Peeji Ha

Ebe e depụtasịrị foto ndị bụ́ isi dị n’akwụkwọ a.