Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

DỌMINIKAN RIPỌBLIK

“M Ma na Alaeze Chineke Ga-abịarịrị”

Efraín De La Cruz

“M Ma na Alaeze Chineke Ga-abịarịrị”
  • A MỤRỤ YA N’AFỌ 1918

  • E MERE YA BAPTIZIM N’AFỌ 1949

  • ONYE Ọ BỤ N’agbanyeghị na a tụọla ya mkpọrọ n’ụzọ ebe asaa, kụọkwa ya akụghị akụ, ọ kwụsịghị ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke.

MỤ NA nwunye m Paula na nwa anyị nwaanyị bidoro ịga ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova n’obodo Blanko Arịba n’afọ 1948. Anyị na-eji ụkwụ aga kilomita iri anọ uje na ụla. N’agbanyeghị nke ahụ, e nwetụghị mgbe anyị hapụrụ ịga ọmụmụ ihe. E mere mụ na nwunye m baptizim n’abalị atọ n’ọnwa Jenụwarị, afọ 1949.

Mgbe ọnwa isii gachara, ndị uwe ojii jidere mụ na ụfọdụ ndị ọgbakọ anyị tụọ anyị mkpọrọ ọnwa atọ. Anyị na-ehi n’ala, a na-enyekwa anyị nri naanị otu ugboro n’ụbọchị. Ihe a na-enye anyị bụ unere na tii. Mgbe a hapụrụ anyị, ndị ọchịchị yiri anyị egwu ma chee na anyị ga-akwụsị ikwusa ozi ọma. Mgbe anyị lọtara, anyị na-ezoro ezoro aga ọmụmụ ihe na ozi ọma. Ndị ọchịchị achọghị iji anya ahụ anyị ebe anyị na-amụ ihe. N’ihi ya, anyị na-amụ ihe n’ụlọ ụmụnna ma ọ bụ n’ebe a kọrọ kọfị ma ọ bụkwanụ n’ubi. Anyị anaghịkwa amụ ihe n’otu ebe. Ọ na-abụ anyị mụchaa ihe n’ebe a, anyị ekwuo ebe ọzọ anyị ga-anọ amụ ihe. Anyị gawa ozi ọma, anyị na-aga otu otu. Anyị na-eyikwa efe ọrụ anyị aga. Anyị anaghịkwa eji Baịbụl ma ọ bụ akwụkwọ anyị. N’agbanyeghị ya, n’agbata afọ 1949 na afọ 1959, a tụrụ m mkpọrọ ugboro asaa. Mkpọrọ nke ọ bụla were ihe dị ka ọnwa atọ ruo ọnwa isii.

M na-akpachapụ anya mgbe ọ bụla n’ihi na ụfọdụ ndị ikwu m so ná ndị na-achọghị iji anya ahụ m. N’agbanyeghị na m na-ehi n’ugwu ma ọ bụ n’ugbo ka a ghara ijide m, mgbe ụfọdụ, a na-ejide m. N’otu oge e jidere m, a kpọgara m n’ụlọ mkpọrọ dị na Kiudad Trujilo. N’ụlọ mkpọrọ a, mmadụ iri ise ruo mmadụ iri isii na-anọ n’otu ọnụ ụlọ. Mgbe anyị nọ ebe ahụ, a na-enye anyị nri ugboro abụọ n’ụbọchị. N’ụtụtụ, a na-enye anyị ọka a kwọrọ akwọ, na-enyekwa anyị obere osikapa na àgwà n’ehihie. Ndịàmà Jehova niile nọ n’ụlọ mkpọrọ ahụ na-ezi ndị mkpọrọ ibe ha ozi ọma. Anyị na-enwechikwa ọmụmụ ihe anya. Otú anyị si enwe ọmụmụ ihe bụ na onye ọ bụla na-ekwu ihe e dere n’amaokwu Baịbụl ndị o bu n’isi, kọọkwa ihe ndị mere mgbe o jere ozi ọma.

Na mkpọrọ ikpeazụ a tụrụ m, onye amị ji isi égbè kụọ m n’isi nakwa n’ọgịrịga. Ihe ndị ahụ ọ kụrụ m na ihe ndị ọzọ e mere m n’ụlọ mkpọrọ ka na-enye m nsogbu n’ahụ́. Ma, ha mere ka okwukwe m sikwuo ike, meekwa ka m na-enwekwu ndidi. Ha mekwara ka m kpebisie ike ịna-efe Jehova.

M dị afọ iri itoolu na isii ugbu a. M bụkwa ohu na-eje ozi n’ọgbakọ anyị. Ọ bụ eziokwu na anakwaghị m agali ebe dị anya, m na-anọ ọdụ n’ihu ụlọ m na-ezi ndị na-agafe agafe ozi ọma. M ma na Alaeze Chineke ga-abịarịrị. Eziela m ndị mmadụ ozi ọma banyere ya ihe karịrị afọ iri isii. M ka kwetasiri ike na a ga-enwe ụwa ọhụrụ otú ahụ m kwetara n’ụbọchị mbụ e ziri m ozi ọma Alaeze Chineke. *

^ para. 3 Nwanna Efraín De La Cruz nwụrụ mgbe a na-ede akụkọ a.