Gaa n'Isiokwu

Ntụziaka Maka Ọmụmụ Ihe Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ

Ntụziaka Maka Ọmụmụ Ihe Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ

Isiokwu Ndị Dị n’Akwụkwọ A

1. Ntụziaka dị n’akwụkwọ a ga-enyere ndị nwere ihe omume n’ọmụmụ ihe Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ aka. Ha ga-atụleghachị ntụziaka dị n’ebe ihe omume ha sitere n’akwụkwọ Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ nakwa ihe e kwuru n’akwụkwọ a tupu ha akwadebewe ihe omume ha. E kwesịrị ịgba ndị nkwusa niile ume ka ha soro na-eme ihe omume ụmụ akwụkwọ. Ndị na-abụghị ndị nkwusa, ma ha na-abịachi ọmụmụ ihe anya nwekwara ike iso na-eme ihe omume ma ọ bụrụ na ha kwetara ihe Baịbụl na-akụzi, na-akpakwa àgwà otú Baịbụl kwuru Onye Kraịst kwesịrị isi na-akpa àgwà. Onye nlekọta Ọmụmụ Ihe Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ kwesịrị iso onye na-abụbeghị onye nkwusa chọrọ iso na-eme ihe omume kwurịta ihe ndị a chọrọ ya n’aka, ọ bụrụ na o ruru eru, e kwesịrị ịgwa ya. Onye na-amụrụ ya ihe (ma ọ bụ nne ma ọ bụ nna ya bụ́ onyeàmà Jehova kwesịrị ịnọ ya) mgbe a na-ekwurịta ihe ahu. O bụ otu ihe ahụ a chọrọ n’aka onye chọrọ ịbụ onye nkwusa a na-emebeghị baptizim ka a chọkwara hanwa n’aka.—od Peeji 8 para. nke 8.

 OKWU MMEGHE

2. Otu nkeji. N’izu ọ bụla, a bụchaa abụ ma kpee ekpere mmeghe, onyeisi oche Ọmụmụ Ihe Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ ga-ekwu okwu mmeghe ga-eme ka ụmụnna tụsiwe anya ike maka ihe ndị a ga-amụ n’ụbọchị ahụ. Ọ ga-elekwasị anya n’ihe ga-abara ọgbakọ uru. 

 AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

 3Okwu: Nkeji iri. A ga na-ede isiokwu ya n’akwụkwọ Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ, deekwa ihe abụọ ma ọ bụ atọ gbara ọkpụrụkpụ a ga-ekwu n’okwu ahụ. Ọ bụ okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi ruru eru ka a ga-ekenye ya. N’izu ọ bụla a ga-ebido ịgụ akwụkwọ Baịbụl ọhụrụ, a ga-ebu ụzọ gosi obere vidio ga-akọwa akwụkwọ Baịbụl ahụ. Onye ga-eme ihe omume a nwere ike ịkọwa otú vidio ahụ si gbasa isiokwu ọ na-ekwu. Ma, ọ ga-ejide n’aka na o kwuchara ihe abụọ ma ọ bụ atọ ahụ gbara ọkpụrụkpụ dị n’akwụkwọ usoro ihe omume. Ọ bụrụ na oge dị, o kwesịrị ịkọwa ihe osise dị n’akwụkwọ usoro ihe omume, n’ihi na e tinyere ha iji mee ka ihe a na-ekwu dokwuo anya. O nwekwara ike ikwu ihe ndị ọzọ o metara na nchọnchọ n’akwụkwọ nzukọ a wepụtara ma ọ bụrụ na ọ ga-eme ka ihe ọ na-ekwu dokwuo anya.

 4Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke: Nkeji iri. Ọ ga-abụ ajụjụ na azịza. Ọ gaghị enwe okwu mmeghe ma ọ bụ okwu mmechi. Ọ bụ okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi ruru eru ga-eme ya. O kwesịrị ịjụcha ajụjụ abụọ ndị ahụ. Ọ ga-ekpebikwa ma à ga-agụ amaokwu Baịbụl ndị dị n’ihe omume a. Onye ọ bụla a kpọrọ ka ọ zaa ajụjụ kwesịrị iji tịnkọm tịnkọm 30 ma ọ bụ ihe na-erughị ya zaa ya.

 5Ọgụgụ Baịbụl: Nkeji anọ. Ọ bụ nwanna nwoke ga-eme ihe omume a. Ọ ga-agụ ebe e kenyere ya n’ekwughị okwu mmeghe ma ọ bụ okwu mmechi. Onye isi oche ọmụmụ ihe a ga-agbasi mbọ ike na-enyere ndị na-eme ihe omume a aka ka ha na-agụzi ihe agụzi, na-agụ ya otú ndị ọzọ ga-aghọta ya, na-agụ ya were were, na-agụ ya ka o doo anya, na-agbanwe ụda olu otú kwesịrị ekwesị, na-akwụsịtụ n’ebe e kwesịrị ịkwụsịtụ, ma na-agụkwa ya otú ha si ekwu okwu. Ebe ọ bụ na ebe ụfọdụ a ga-agụ na Baịbụl nwere ike ịdị mkpụmpụ ụfọdụ adị ogologo, n’ihi ya, onye nlekọta Ọmụmụ Ihe Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ kwesịrị iburu ikike nwa akwụkwọ nke ọ bụla n’uche mgbe ọ na-eke ihe omume a.

 MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA

6. Nkeji iri na ise. A haziri agba a ka o nyere anyị aka ịkwadebe ozi ọma na ịmụtakwu otú anyị ga-esi na-ezi ozi ọma ma na-akuzi ihe nke ọma. Mgbe ụfọdụ, e nwekwara ike ikenye okenye ihe omume ụmụ akwụkwọ. Nwa akwụkwọ nke ọ bụla kwesịrị ịrụ ọrụ n’ihe ọmụmụ e kwuru ka a rụọ ọrụ na ya na broshọ Izi Ihe ma ọ bụ Hụ Ndị Mmadụ n’Anya, a ga-ede ya n’akara kpakpando dị n’akụkụ ihe omume ahụ n’akwụkwọ Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ. Mgbe ụfọdụ, aga-enwe ihe omume ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Ya dị otú ahụ, ọ bụ okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi ruru eru ka aga-ekenye ya.—Gụọ  paragraf nke 15 maka otú e si eme ihe omume ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.

 7Ịmalite Mkparịta Ụka: E nwere ike ikenye nwoke ma ọ bụ nwaanyị ihe omume a. E kenye ya nwoke, onye ya na ya ga-eme ya kwesịrị ịbụ nwoke ibe ya ma ọ bụ onye ezinụlọ ya, e kenyekwanụ ya nwaanyị, onye ya na ya ga-eme ya kwesịkwara ịbụ nwaanyị ibe ya, ma ọ bụ onye ezinụlọ ya. Ha nwere ike ịnọdụ ala ma ọ bụ guzoro ọtọ mee ya, gụọ  paragraf nke 12 na  13

 8N’Oge Ọzọ: E nwere ike ikenye nwoke ma ọ bụ nwaanyị ihe omume a. E kenye ya nwoke, onye ya na ya ga-eme ya kwesịrị ịbụ nwoke ibe ya ma ọ bụ onye ezinụlọ ya, e kenyekwanụ ya nwaanyị, onye ya na ya ga-eme ya kwesịkwara ịbụ nwaanyị ibe ya, ma ọ bụ onye ezinụlọ ya. Ha nwere ike ịnọdụ ala ma ọ bụ guzoro ọtọ mee ya. (km 5/97 p. 2) Onye ga-eme ihe omume a kwesịrị igosi ihe a ga-ekwu ma a gaghachi na nke onye gosiri mmasị ná nleta mbu.—Maka ihe a chọrọ ka i mee n’ihe omume a na otú ị ga-esi eme ya, gụọ  paragraf 12 na  13.

 9Ime Ka Ha Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs: E nwere ike ikenye nwoke ma ọ bụ nwaanyị ihe omume a. E kenye ya nwoke, onye ya na ya ga-eme ya ga-abụ nwoke ibe ya, e kenyekwanụ ya nwaanyị, onye ya na ya ga-eme ya ga-abụkwa nwaanyị ibe ya. (km 5/97 p. 2) Ha nwere ike ịnọdụ ala ma ọ bụ guzoro ọtọ mee ya. Onye ga-eme ihe omume a ga-eme ya otú ga-egosi na ha amụwala Baịbụl amụwa, ọ bụghị ka ha ka chọrọ ịmalite amalite. N’ihi ya, ọ dịghị mkpa ikwu okwu mmeghe ma ọ bụ okwu mmechi, ọ gwụkwala ma a gwara ya na ebe a ga-ele ya anya bụ n’okwu mmeghe ma ọ bụ n’okwu mmechi. Ọ bụghị iwu na a ga-agụpụta paragraf niile a na-amụ, ma, e nwekwara ike ịgụ ha.

 10Ịkọwa Ihe Ndị I Kweere: Ọ bụrụ okwu, a ga-ekenye ya nwoke. Ma ọ bụrụ ihe ngosi, e nwere ike ikenye ya nwoke ma ọ bụ nwaanyị. E kenye ya nwoke, onye ya na ya ga-eme ya kwesịrị ịbụ nwoke ibe ya ma ọ bụ onye ezinụlọ ya, e kenyekwanụ ya nwaanyị, onye ya na ya ga-eme ya kwesịkwara ịbụ nwaanyị ibe ya, ma ọ bụ onye ezinụlọ ya. Onye ga-eme ihe omume a ga-eji akọ zaa ajụjụ dị n’ihe omume ya otú ọ ga-edo anya, ọ ga-eji ihe e kwuru n’ebe ihe omume ahụ sitere eme ya. Ọ bụ ya ga-ekpebi ma ọ ga-adọrọ uche onye ya na ya na-ekwu okwu gaa n’akwụkwọ e si nweta ihe omume ya ma ọ bụ na ọ gaghị eme otú ahụ.

 11Okwu: Ihe omume a ga-abụ okwu nwoke ga-agwa ọgbakọ. Ọ bụrụ na ebe e si nweta ihe omume a bụ n’ihe ndị ọzọ a kọwara nke A na broshọ bụ́ Hụ Ndị Mmadụ n’Anya, onye ga-eme ya ga-akọwa otú a ga-esi e ji amaokwu Baịbụl ahụ zie ozi ọma. Dị ka ihe atụ, ọ ga-akọwa mgbe e nwere ike ịgụrụ mmadụ amaokwu Baịbụl ahụ, ihe ebe ahụ na-ekwu, nakwa otú anyị ga-esi akọwara ya mmadụ. Ọ bụrụ na ebe e si nweta ihe omume a bụ n’otu ihe ọmụmụ na broshọ bụ́ Hụ Ndị Mmadụ n’Anya, ọ ga-akọwa otú a ga-esi eme ihe onye a kọrọ akụkọ ya ná mmalite ihe ọmụmụ ahụ mere, ọ bụrụ na ọ dị mkpa, o nwekwara ike ịkọwa ihe e kwuru na paragraf ndị ọzọ dị n’ihe ọmụmụ ahụ.

   12Ihe A Chọrọ Ka E Mee: Ihe e kwuru na paragraf a nakwa na nke na-eso ya bụ́ otú a ga-esi eme ihe omume bụ́ “Ịmalite Mkparịta Ụka” na “n’Oge Ọzọ.” Ihe ga-abụ mkpa onye ga-eme ihe omume a kwesịrị ịbụ ịkụziri onye ya na ya na-akparịta ụka otu eziokwu Baịbụl dị mfe bụ nke kwekọrọ n’ọnọdụ ya nakwa iyi ágbà maka nleta ọzọ, ọgwụkwala ma e kwuru ka e mee ihe dị iche. Onye ga-eme ihe omume a ga-ahọrọ isiokwu dabara adaba nke ga-amasịkwa ndị bi n’ebe unu na-ezi ozi ọma. Ọ ga-ekpebikwa ma ọ̀ ga-enye onye ahụ akwụkwọ ma ọ bụ gosi ya vidio si n’Ihe Ndị Anyị Ji Akụzi Ihe ma ọ bụ na ọ gaghị eme otú ahụ. Kama iburu ihe ndị a ga-ekwu n’isi, ụmụ akwụkwọ ga-agbalị ịmụta ụzọ dị iche iche e si eso mmadụ akparịta ụka, dị ka, otú e si egosi ndị ọzọ mmasị, nakwa otú e si amalite mkparịta ụka ka mkparịta ụka nkịtị.

   13Otú A Ga-esi Eme Ya: Onye ga-eme ihe omume a, ga-eme ya ka o kwekọọ n’otú ihe si dịrị n’ebe unu na-ezi ozi ọma. Dị ka ihe atụ:

  1.  (1) Ozi Ụlọ n’Ụlọ: Otú a ga-esi eme ya bụ́ igosi otú e si ezi ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ, o nwere ike ịbụ ihu na ihu, n’ekwentị, ma ọ bụ site n’akwụkwọ ozi, nakwa otú a ga-esi agaghachi na nke onye e ziri ozi ọma n’ozi ụlọ n’ụlọ.

  2.  (2) Ịgba Àmà Mgbe A Na-anọghị n’Ozi: Otú a ga-esi eme ya bụ́ igosi otú a ga-esi eji ohere ọ bụla dapụtaranụ mgbe anyị na ndị mmadụ na-akparịta ụka zie ha ozi ọma. Ọ nwere ike ịbụ, mmadụ na onye ọrụ ibe ya, ụmụ akwụkwọ ibe ya, ndị agbata obi ya, ndị ya na ha bakọrọ ụgbọala ma ọ bụ ndị ọ hụrụ mgbe ọ na-eme ihe ndị dịịrị ya n’ụbọchị.

  3.  (3) Ịgba Àmà n’Ebe Ndị Mmadụ Na-anọkarị: Otú a ga-esi eme ya bụ́ igosi otú a ga-esi eji ihe a na-akwagharị akwagharị ezi ozi ọma, izi ozi ọma n’ebe ndị mmadụ na-akpa afọ ha, n’okporo ụzọ, n’ebe a na-abanye ụgbọala, ma ọ bụ n’ebe a na-adọsa ụgbọala, ma ọ bụkwanụ n’ebe ọ bụla ọzọ e nwere ike ịhụ ndị mmadụ.

 14Iji Akwụkwọ na Vidio Eme Ihe Omume: Dabere n’otú ihe si dịrị, onye e kenyere ihe omume a ga-ekpebi ma ọ ga-egosi vidio ma ọ bụ nyefee akwụkwọ. Ọ bụrụ na ihe omume ahụ nwere vidio ma ọ bụ na onye ahụ kpebiri igosi vidio, ọ ga-ekwu isiokwu vidio ahụ, ha e kwurịtazie ihe e kwuru na ya, ma, ọ gaghị akpọnye vidio ahụ.

  OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

15. A bụchaa abụ, ihe omume ga-esochinụ ga-ewe nkeji 15. O nwere ike ịbụ otu ihe omume ma ọ bụ abụọ ga-enyere anyị aka ịna-eme ihe Okwu Chineke kwuru. Ọ bụ okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi ruru eru ka a ga-ekenye ihe omume a, ọ gwụkwala ma è nyere ntụziaka dị iche. Ma, ọ bụ naanị ndị okenye ka a ga na-ekenye ihe omume mkpa ọgbakọ. Ọ bụrụ ihe omume ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ, nwanna ga-eme ihe omume ahụ ga-ajụ ndị na-ege ntị ajụjụ niile e depụtara ebe ahụ, o nwekwara ike ịjụ ajụjụ ntụkwasị ndị ga-eme ka a ghọtakwuo ihe isiokwu ahụ na-ekwu. Ọ ga-eme ka okwu mmeghe ya dị nkenke, ka o nwee ike iwepụtacha ihe ndị bụ́ isi dị n’ihe omume ahụ, ya e nweekwa oge ọ ga-eji ajụ ndị na-ege ntị ajụjụ ndị ahụ. Ọ bụrụ na-aga agba mmadụ ajụjụ ọnụ n’ihe omume ahụ, ọ ga-aka mma ka onye ahụ gbagote n’elu ikpo okwu ma ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee, kama ịnọ n’oche ya.

  16Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ: Nkeji iri atọ. Ọ bụ okenye ruru eru ka a ga-ekenye ihe omume a. (N’ọgbakọ e nwere ndị okenye ole na ole, ohu na-eje ozi ruru eru nwere ike iduzi ya.) Ọ bụ ndị okenye ga-ekpebi okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi ruru eru ịna-eduzi ya. Ndị a họpụtara ka ha na-eduzi ọmụmụ ihe a kwesịrị iduzi ya nke ọma ka ha nwee ike iduzicha ya n’oge e kenyere ha. Ha ga-eme ka ụmụnna ghọta amaokwu Baịbụl ndị gbara ọkpụrụkpụ dị na paragraf ndị a na-amụ, nakwa otú ha ga-esi eme ihe ndị ha mụtara. Ha kwesịrị ịgụ ihe ndị e kwuru n’akwụkwọ anyị banyere otú e si eduzi ihe omume bụ́ ajụjụ na aziza, ka ha nwee ike ịma otú ha ga-esi na-eduzi ihe omume a. (w23.04 p. 24, igbe) Ọ bụrụ na e wepụtachaala isi ihe dị n’ebe a na-amụ n’izu ahụ, ọ dịghị mkpa ịgbatịwa ọmụmụ ihe ahụ. O kwe mee, e kwesịrị ịna-agbanwe ndị ga na-eduzi ya, na ndị ga na-agụpụta ihe a na-amụ n’izu ọ bụla. Ọ bụrụ na onyeisi oche Ọmụmụ Ihe Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ e kwuo ka a ghara ijicha nkeji iri atọ duzie ya, nwanna ga-eduzi ya ga-ekpebi ihe ọ ga-eme iji gbubilata oge. O nwere ike ikpebi ka a hapụ ịgụ paragraf ụfọdụ.

  OKWU MMECHI

17. Nkeji atọ. Onyeisi oche Ọmụmụ Ihe Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ ga-ekwughachi ihe ndị dị ezigbo mkpa a mụrụ n’ụbọchị ahụ. Ọ ga-ekwukwa ihe a ga-amụ n’izu ọzọ. O nwekwara ike ịkpọ aha ndị ga-eme ihe omume ụmụ akwụkwọ n’izu ọzọ, ma ọ bụrụ na oge dị. Ọ bụ n’oge a ka ọ ga-ama ọkwa ọ bụla e kwesịrị ịmara ọgbakọ ma ọ bụ gụọ akwụkwọ ozi ọ bụla e kwesịrị ịgụrụ ha, ọ gwụkwala ma è kwuru ka e mee ya n’oge ọzọ. E kwesịghị ịna-ama ọkwa ihe ndị dị ka ebe a ga-ezukọ ma ọ bụ ebe a ga-aga ozi ọma, ma ọ bụkwanụ otú a ga-esi na-edebe Ụlọ Nzukọ Alaeze ọcha. A ga-amapawa ihe ndị ahụ na bọọdụ ịma ọkwa. Ọ bụrụ na nkeji atọ a agaghị ezuru onyeisi oche iji kwuo okwu mmechi ya, maakwa ọkwa ma ọ bụ gụọ akwụkwọ ozi ndị o kwesịrị ịgụ, o kwesịrị ịgwa ụmụnna ndị ga-eme ihe omume ndị e nwere ná nkebi nke ikpeazụ, bụ́ Otú Ndị Kraịst Si Ebi Ndụ, ka ha gbuo ihe omume ha nkenke. (Gụọ  paragraf 16 na  19) A ga-eji abụ na ekpere mechie ọmụmụ ihe a.

  ỊJA MMA NA INYE NDỤMỌDỤ

18. Ọ bụrụ na onye nke ọ bụla e kenyere ihe omume ụmụ akwụkwọ e mechaa ihe omume ya, onyeisi oche Ọmụmụ Ihe Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ ga-eji ihe dị ka otu nkeji jaa ya mma ma nyekwa ya ndụmọdụ dabere n’ebe a na-ele ya anya. Mgbe onyeisi oche na-akpọpụta nwa akwụkwọ ga-eme ihe omume nke ọ bụla, ọ gaghị ekwu ihe ọmụmụ nke a na-ele ya anya na ya. Nwa akwụkwọ ahụ mechaa ihe omume ya, onyeisi oche ga-aja ya mma, kwuokwa ebe e lere ya anya. Ọ bụrụ na o mere nke ọma, ọ ga-ekwu ya, kwuokwa ihe mere o ji bụrụ na o mere nke ọma. Ma, ọ bụrụ na o mechaghị nke ọma, ọ ga-emedakwa obi kwuo ebe o kwesịrị imezikwu ihe nakwa otú ọ ga-esi eme ya. Onyeisi oche ahụ nwekwara ike ikwu ihe ndị ọzọ gbasara ihe omume ahụ ma ọ bụrụ na o chere na ọ ga-abara nwa akwụkwọ ahụ ma ọ bụ ndị ọzọ uru. O nwekwara ike imeda obi ma jiri broshọ Hụ Ndị Mmadụ n’Anya, broshọ Izi Ihe ma ọ bụ akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi nyekwuo onye mere ihe omume ndụmọdụ mgbe naanị ya na ya nọ. O nwere ike ime ya ma a gbasaa ọmụmụ ihe ma ọ bụkwanụ n’oge ọzọ. Ndụmọdụ ọ ga-enyekwu nwere ike ịgbasa ebe e lere ya anya ma ọ bụkwanụ n’ihe ọzọ.—Ị chọọ ịmatakwu banyere ọrụ onye isi oche Ọmụmụ Ihe Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ na ọrụ onye na-enye ndụmọdụ, gụọ  paragraf 19,  24, na  25.

     IDEBE OGE

19O nweghị ihe omume nke kwesịrị ịgafe oge e kenyere maka ya. Onye isi oche Ọmụmụ Ihe Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ e kwesịghịkwa iri oge. N’agbanyeghị na e dere oge a ga-eji eme ihe omume nke ọ bụla n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ, e wepụtachaa isi ihe ndị a chọrọ ka a mụta n’ihe omume ahụ, ọ dịghị mkpa imerekwa ihe omume ahụ na-aga naanị n’ihi na oge e kenyere ihe omume ahụ agwụbeghị. Ọ bụrụ na onye mere ihe omume erie oge, onye isi oche Ọmụmụ Ihe Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ ma ọ bụ onye na-enye ndụmọdụ ga-enye onye ahụ ndụmọdụ, ma ọ gaghị abụ n’ihu ọha. (Gụọ  paragraf 24 na  25.) Ihe niile a ga-eme n’ọmụmụ ihe a, ma abụ ma ekpere, ga-ewe otu awa na nkeji iri anọ na ise.

 IZU ONYE NLEKỌTA SEKIT GA-ELETA ỌGBAKỌ

20. Onye nlekọta sekit bịa ileta ọgbakọ, ọgbakọ ga-enwe ọmụmụ ihe otú ahụ e si hazie ya n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ. Naanị ihe ga-agbanwe bụ na a gaghị enwe Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ. Kama, onye nlekọta sekit ga-eji oge ahụ kwuo okwu ije ozi ya ga-ewe nkeji 30. Ma tupu ya ekwuwe okwu ya, onyeisi oche Ọmụmụ Ihe Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ ga-achịkọta ihe niile a mụrụ n’ụbọchị ahụ, kwuo ihe ndị a ga-amụ n’izu ọzọ, maa ọkwa ndị e kwesịrị ịma, gụọ akwụkwọ ozi ndị e kwesịrị ịgụ, ma kpọpụtazie onye nlekọta sekit. Onye nlekọta sekit kwuchaa okwu ya, ọ ga-eji abụ ọ bụla ọ họọrọ mechie ọmụmụ ihe ahụ. Ọ chọọ, o nwere ike ịkpọ nwanna nwoke ọzọ ka o kpee ekpere mmechi. A gaghị enwe klas ọzọ n’izu ahụ onye nlekọta sekit na-eleta ọgbakọ. Ìgwè na-amụ ihe n’asụsụ ọzọ nwere ike ịmụ ihe nke ha. Ma, o ruo mgbe onye nlekọta sekit ga-ekwu okwu ije ozi ya, ha ga-esonyere ọgbakọ gee okwu ya.

 IZU ỌGBAKỌ GA-AGA MGBAKỌ SEKIT MA Ọ BỤ MGBAKỌ UKWU

21. Ọmụmụ ihe agaghị adị n’izu ọgbakọ ga-aga mgbakọ sekit ma ọ bụ mgbakọ ukwu. E kwesịrị ichetara ụmụnna ka ha tụlee ihe omume nke izu ahụ mgbe ha na-amụ ihe n’onwe ha ma ọ bụ n’ofufe ezinụlọ ha.

 IZU A GA-ECHETA ỌNWỤ JIZỌS

22. Ọ bụrụ na ụbọchị a ga-echeta ọnwụ Jizọs dabara n’ụbọchị Mọnde ruo Fraịdee, a gaghị enwe Ọmụmụ Ihe Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ n’izu ahụ

 ONYE NLEKỌTA ỌMỤMỤ IHE OZI ANYỊ NA OTÚ ANYỊ SI EBI NDỤ

23. Ọ bụ okenye ndị okenye họpụtara ga-abụ onye nlekọta Ọmụmụ Ihe Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ. Ọrụ ya bụ ịhụ na a haziri ọmụmụ ihe a nke ọma nakwa na a na-eme ihe niile otú e kwuru ka e si na-eme ya n’akwụkwọ a. Ya na onye na-enye ndụmọdụ kwesịrị ịna-arụkọ ọrụ. Onye nlekọta Ọmụmụ Ihe Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ nwetahaala Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ, ọ ga-ebido ozugbo ike ihe omume ahụ a ga-eme n’ime ọnwa abụọ nọ n’akwụkwọ ahụ. Nke ahụ gụnyere ihe omume na abụghị nke ụmụ akwụkwọ, onye isi oche ọmụmụ ihe etiti izu, ma, ọ ga-abụ ndị ahụ ndị okenye kpebiri na ha ruru eru, nakwa ihe omume ụmụ akwụkwọ. (Gụọ  paragraf 3-16 na  24) Mgbe ọ na-eke ihe omume ụmụ akwụkwọ, ọ ga-eburu n’uche afọ ndụ ha, ihe ọmụma ha, nakwa ma ọnụ ọ̀ ga-akali onye ahụ ime ihe omume ahụ. Ọ ga-eburukwa ihe a n’uche mgbe ọ na-eke ihe omume ndị ọzọ. E kwesịrị inye ndị ga-eme ihe omume ndị a ihe omume ha ọ́ dịkarịa ala izu atọ tupu oge ha ga-eme ihe omume ha. Ọ bụ fọm bụ Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ (S-89) ka a ga-eji ede ihe omume ụmụ akwụkwọ. Onye nlekọta Ọmụmụ Ihe Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ ga-ahụ na a mapawara akwụkwọ ebe e dere aha ndị niile nwere ihe omume na bọọdụ ịma ọkwa. Ndị okenye nwere ike ịhọpụta otu okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi ga na-enyere ya aka, ma ọ bụ naanị okenye ga na-eke ihe omume na-abụghị nke ụmụ akwụkwọ.

    ONYEISI OCHE ỌMỤMỤ IHE OZI ANYỊ NA OTÚ ANYỊ SI EBI NDỤ

24. N’izu ọ bụla, otu okenye ga-abụ onyeisi oche n’Ọmụmụ Ihe Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ. (N’ọgbakọ ndị e nwere okenye ole na ole, ohu na-eje ozi ruru eru nwere ike iduzi ya.) Ọ bụ ọrụ onyeisi oche ịkwadebe okwu mmeghe na okwu mmechi ya. Ọ bụkwa ya ga-akpọpụta ndị niile ga-eme ihe omume, ọ bụrụkwa na ndị okenye adịghị ọtụtụ, o nwekwara ike ime ihe omume ụfọdụ n’ọmụmụ ihe ahụ, karịcha ihe omume ndị bụ́ vidio a na-agaghị ekwu ihe ọ bụla ma ọ kpọchaa ha. Mmadụ mechaa ihe omume, o kwesịghị ikwu ọtụtụ okwu tupu ya akpọpụta onye ọzọ. Ọ bụ ndị okenye niile ga-ekpebi okenye ruru eru ịbụ onyeisi oche ọmụmụ ihe a. A ga na-ekenye okenye ọ bụla a họpụtara izu nke ọ ga-abụ onyeisi oche. Ọ bụ otú ihe si dịrị n’ọgbakọ ga-ekpebi ma à ga na-ekenye onye nlekọta Ọmụmụ Ihe Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ ịbụ onyeisi oche ọmụmụ ihe a karịa ndị okenye ndị ọzọ ruru eru. Ọ bụrụ na okenye ruru eru iduzi Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ, ọ ga-abụkwa na o rukwara eru ịbụ onyeisi oche n’ọmụmụ ihe a. Ma, biko burunụ n’obi na okenye ga-abụ onyeisi oche ga na-eji obiọma aja ndị mere ihe omume mma, na-emedakwa obi ma o nyewe ụmụ akwụkwọ ndụmọdụ ndị ga-abara ha uru. Ọ bụkwa ya ga na-ahụ na a gbasara ọmụmụ ihe n’oge e kwesịrị ịgbasa ya. (Gụọ  paragraf 17 na  19) Ọ bụrụ na ohere dị n’elu ebe ikpo okwu maka idowe maịkrofon ọzọ onyeisi oche ga-eji na-akpọpụta ndị na-eme ihe omume, ya abụrụkwa na yanwa chọrọ, e nwere ike idowere ya maịkrofon ahụ otú ọ ga-abụ, ya jiri ya na-akpọpụta onye ga-eme ihe omume, onye ahụ agaa guzoro na tebụl ikpo okwu, na-eche ka o kwuchaa. Ọ bụrụkwa na onyeisi oche ahụ chọrọ, e nwere ike idowere ya oche n’ikpo okwu ebe ọ ga-anọrọ ọdụ mgbe Ọgụgụ Baịbụl na-aga n’ihu nakwa n’oge Mụtakwuo Izi Ozi Ọma nke Ọma. Ime ya otú ahụ nwere ike ime ka a ghara ịtụfu oge ọ bụla.

   ONYE NA-ENYE NDỤMỌDỤ

25. Ọ kacha mma ịhọpụta okenye maara otú e si ekwu okwu nke ọma ka ọ na-arụ ọrụ a. Ọrụ ya bụ inye okenye na ohu na-eje ozi ọ bụla ndụmọdụ ma e nwee ebe ha kwesịrị imezikwu ihe n’ihe omume ọ bụla ha mere, ma ọ bụ n’Ọmụmụ ihe Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ, ma ọ bụ ma ha kwuo okwu ihu ọha, ma ọ bụ duzie Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche, ma ọ bụ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ, ma ọ bụkwanụ gụpụtara ọgbakọ Ụlọ Nche ma ọ bụ akwụkwọ e ji amụ ihe n’Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ. Mana, ọ gaghị abụ n’ihu ọha. (Gụọ  paragraf 19) Ọ bụrụ na e nwere ọtụtụ ndị okenye na-ekwu okwu nke ọma ma na-akụzikwa ihe nke ọma n’ọgbakọ, e nwere ike ịna-ahọpụta otu n’ime ha kwa afọ ka ọ bụrụ onye na-enye ndụmọdụ. Ọ bụghị mgbe niile okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi mere ihe omume ka onye na-enye ndụmọdụ ga-enye ya ndụmọdụ.

 KLAS ỌZỌ

26. Ọ bụrụ na e nwere ọtụtụ ndị na-eme ihe omume ụmụ akwụkwọ, ọgbakọ nwere ike ịhazi ka e nwee klas ọzọ. Klas ọ bụla kwesịrị inwe onye ruru eru ga na-eduzi ya. Ọ kacha mma ka onye ahụ bụrụ okenye. N’ọgbakọ a na-enweghị okenye ga-eduzi ya, ohu na-eje ozi ruru eru nwere ike iduzi ya. Ọ bụ ndị okenye niile ga-ekpebi onye ga na-eduzi klas a. Ọ bụkwa ha ga-ekpebi ma ọ̀ ga-abụ otu onye duzichaa n’izu a, onye ọzọ eduzie n’izu ọzọ, ma ọ bụkwanụ na otu onye ga na-eduzi ya. Onye ga-eduzi ya kwesịrị iso ntụziaka e nyere na  paragraf nke 18. Ọ bụrụ na e nwere klas ọzọ, e kwesịrị ịgwa ndị e kenyere ihe omume na klas ahụ ka ha gaa na klas ha ma e mechaa ihe omume a kpọrọ Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke, bụ́ nke a na-eme n’agba nke mbụ a kpọrọ Akụ̀ Ndị Si n’Okwu Chineke. Ha kwesịrị ịbataghachi ma e mechaa ihe omume ikpeazụ nke ụmụ akwụkwọ n’ọmụmụ ihe ahụ.

 VIDIO

27. E nwere vidio ụfọdụ a ga na-ele n’ọmụmụ ihe a. Vidio ndị a ga-egosi n’izu ọ bụla n’ọmụmụ ihe anyị ga na-adị na JW Library. E nwere ike iji kọmputa ma ọ bụ ekwentị si n’ebe ahụ danloduo ha.

© 2023 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania

S-38-IB 11/23