Gaa n'Isiokwu

Ọ Bụ Naanị Jehova Bụ Ezi Chineke

N’ihe dị ka puku afọ atọ gara aga, mgbe Ehab na-achị Izrel, oge ruru ka a mata mbe abụọ nke bụ́ oké, ya bụ, ka a mata ma Chineke ọ̀ ka ndị ajọ omume ike ka ọ̀ bụ ndị ajọ omume ka ya ike. Ịlaịja, bụ́ ohu ezi Chineke, guzo n’Ugwu Kamel, ya na ndị Izrel na-enweghị okwukwe, eze ha bụ́ Ehab, na ndị nchụàjà Bel bụ́ ndị na-achọ otú ha ga-esi egbu Ịlaịja. Ma, Jehova kwụ Ịlaịja n’azụ. Ka anyị hụ otú Jehova si gosi na ọ bụ naanị ya bụ ezi Chineke nakwa otú o si egosi ya n’oge anyị a.

E dere akụkọ a ná 1 Ndị Eze 16:29-33; 1 Ndị Eze 17:1-7; 1 Ndị Eze 18:17-46 nakwa ná 1 Ndị Eze 19:1-8.