Gaa n'Isiokwu

Ihe Anyị Ga-eji Ihe Ị Gwara Anyị Gbasara Onwe Gị Eme​—⁠Latvia

Ihe Anyị Ga-eji Ihe Ị Gwara Anyị Gbasara Onwe Gị Eme​—⁠Latvia

Ozugbo mmadụ ghọrọ onye nkwusa, onye ahụ ga-abịanye aka n’akwụkwọ gosiri na ya ekwetala ka ọgbakọ Ndịàmà Jehova zuru ụwa ọnụ, ma ọgbakọ ha dị iche iche ma alaka ụlọ ọrụ ha ma ụlọ niile ha ji arụ ọrụ, jiri ihe niile onye ahụ gwara Ndịàmà Jehova gbasara onwe ya na-arụ ọrụ otú iwu kwadoro. Ndị nkwusa ndị a na-eji obi ha niile gwa ọgbakọ ha nọ na ya ihe gbasara onwe ha otú e nyere ntụziaka ya n’akwụkwọ Ndị A Haziri Ime Uche Jehova ka ha nwee ike soro ọgbakọ ha na-ejere Chineke ozi nakwa ka ndị nlekọta ọgbakọ ahụ nwee ike ịna-azụ ha.​—⁠1 Pita 5:⁠2.

Ndị nkwusa nwekwara ike ịgwa Ndịàmà Jehova ihe ndị ọzọ gbasara onwe ha ka ha na-arụ ọrụ ndị ọzọ gbasara ife Chineke. Ụfọdụ ihe ha nwere ike ikwu gbasara onwe ha bụ: aha ha, ụbọchị a mụrụ ha, ma hà bụ nwoke ma ọ bụ nwaanyị, ụbọchị e mere ha baptizim, adres ha na akara ekwentị ha, ihe ndị ga-eme ka okwukwe ha sie ike, ihe gbasara ozi ọma ha na-ekwusa, ma ọ bụ ọrụ ọ bụla ha na-arụ n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova. Ha nwekwara ike ime ka a mata ihe ha kweere na ihe ndị ọzọ nwere ike ịbụ ihe nzuzo gbasara onwe ha. E nwere ike ịchịkọta ihe ndị ahụ, tinye ha na teepụ, hazie ha, dewe ha ma ọ bụ jiri ha mee ihe ndị ọzọ.

Iwu Ndị E Mere Gbasara Ihe A Ga-eji Ihe Ị Gwara Anyị Gbasara Onwe Gị Mee ná Mba a bụ:

Personal Data Processing Law and General Data Protection Regulation (EU) 2016/⁠679.

N’ihi ihe e kwuru n’iwu a, ndị nkwusa ga-abịanye aka n’akwụkwọ gosiri na ha kwetara ka Ndịàmà Jehova jiri ihe ndị ha kwuru gbasara onwe ha mee ihe ndị e kwuru ebe a nakwa ihe ndị ọzọ gbasara ọrụ ha na-arụ:

  • ịga ọmụmụ ihe ọ bụla a na-enwe n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova ha nọ na ya nakwa na ha ga-ewepụta onwe ha soro rụọ ọrụ ọ bụla Ndịàmà Jehova na-arụ;

  • ikpebi ịga ọmụmụ ihe, mgbakọ sekit ma ọ bụ mgbakọ ukwu e tinyere n’ihe a na-egere egere ma na-akpọ ya iji kụziere Ndịàmà Jehova ihe n’ụwa niile;

  • ime ihe omume ọ bụla e kenyere ha ma ọ bụ ịrụ ọrụ ọ bụla ọzọ a gwara ha rụọ n’ọgbakọ ha, bụ́ ọrụ e denyere aha ha na ya ma mapawa ya na bọọdụ ịma ọkwa dị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze Ndịàmà Jehova;

  • inwe Kaadị Onye Nkwusa;

  • ka ndị okenye Ndịàmà Jehova na-azụ ha na-elekọta ha (Ọrụ Ndịozi 20:28; Jems 5:​14, 15);

  • ikwe ka e dee aha ha, adres ha, na ihe ndị ọzọ ga-enye aka ịchọta ha ma ihe gbata gbata mee.

A ga-echekwa ihe ndị ahụ ị gwara anyị gbasara onwe gị n’oge niile e ji ya na-eme ihe ndị a anyị kwuru ma ọ bụkwanụ otú iwu kwadoro ka e mee ruo oge a na-akapịghị ọnụ. Ọ bụrụ na onye nkwusa ekweghị abịanye aka na fọm bụ́ M Kwetara Ka E Jiri Ihe M Kwuru Banyere Onwe M Rụọ Ọrụ, Ndịàmà Jehova agaghị enwe ike ịmata ma ò ruru eru ka a họpụta ya ịrụ ọrụ ụfọdụ n’ọgbakọ ma ọ bụkwanụ iso mee ihe ụfọdụ a na-eme n’ọgbakọ.

Anyị nwere ike izigara ụlọ ọrụ ndị anyị ji arụ ọrụ ihe gbasara gị ma ọ dị mkpa ma dabakwa adaba ime otú ahụ. Ndị nkwusa ghọtara na ụfọdụ n’ime ụlọ ọrụ ndị ahụ anyị ji arụ ọrụ nwere ike ịdị ná mba ọzọ ebe iwu ha maka ihe a ga-eji ihe mmadụ kwuru gbasara onwe mee nwere ike ịdị iche. Mgbe ụfọdụ, iwu ndị ahụ na-adị iche na nke obodo e si ziga ihe mmadụ kwuru gbasara onwe ya. Ma, ndị nkwusa ghọtara na ndị e zigaara ihe ndị a, ma ụlọ ọrụ ndị dị n’isi ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị n’Amerịka, ga-eme ihe e kwuru n’Iwu Zuru Ụwa Ọnụ Ndịàmà Jehova Na-eso ma A Bịa n’Ihe Mmadụ Gwara Ha Gbasara Onwe Ya mgbe ha ji ya na-arụ ọrụ.

Ndị nkwusa nwere ikike ịhụ ihe Ndịàmà Jehova dere gbasara ha, ikwu ka a kagbuo ya ma ọ bụ kwụsị iji ya arụ ọrụ ma ọ bụ ka e dezigharịa ihe ọ bụla e dehiere na ya. Ndị nkwusa nwere ike ikwu na ha achọghịzi ka e jiri ihe ha kwuru gbasara onwe ha mee ihe ụfọdụ a chọrọ ime n’ọdịnihu. Onye nkwusa kwuo na ya achọghịzi ka e jiri ihe ndị o kwuru gbasara onwe ya na-arụ ọrụ, Ndịàmà Jehova ka nwere ike iji ụfọdụ n’ime ihe ndị ahụ na-arụ ọrụ n’agbanyeghị ihe onye ahụ kwuru n’ihi ikike iwu nyere ha idekọ ihe gbasara ndị so ná ndị òtù ha n’ụwa niile ma ọ bụ n’ihi ihe ọzọ iwu kwadoro e kwuru n’Iwu Gbasara Ichebe Ihe Mmadụ Kwuru Banyere Onwe Ya. Ndị nkwusa ma na ha nwere ikike ịgwa ụlọ ọrụ gọọmenti ihe ọ bụla e mere ha na-adịghị ha mma, ya bụ, ụlọ ọrụ ndị na-eleba anya n’ụdị okwu a ná mba ha bi.

Ndịàmà Jehova na-eme ihe dị iche iche ka a ghara iji ihe mmadụ gwara ha gbasara onwe ya mee ihe onye ahụ na-achọghị, dị ka e kwuru n’Iwu Gbasara Ichebe Ihe Mmadụ Kwuru Banyere Onwe Ya. Ndị nkwusa ghọtara na e nwere mmadụ ole na ole e nyere ikike iji ihe ndị a na-eme ihe ndị ahụ anyị kwurula.

I nwee ajụjụ ọ bụla gbasara ihe e kwuru ebe a, zigara ya onye na-ahụ maka ya n’adres iimel dị ebe a:

DataProtectionOfficer.LV@jw.org.

Ndị nkwusa ghọtara na aha na adres na ihe ndị ọzọ gbasara onye na-ahụ maka ụdị okwu a na onye na-anọchite anya ya n’obodo ebe ha bi dị n’ebe e dere Ndị Ị Ga-akpọtụrụ Maka Ihe Ị Gwara Anyị Gbasara Onwe Gị na jw.org.

Otú anyị si eji ihe ndị i kwuru gbasara onwe gị arụ ọrụ nwere ike ịgbanwe mgbe ụfọdụ n’ihi otú ọrụ anyị, iwu obodo, ma ọ bụ ihe gbasara nkà na ụzụ si agbanwe. E nwehaala ihe mere ka ọ dị mkpa ka anyị gbanwee ihe ọ bụla n’ebe e dere Ihe Anyị Ga-eji Ihe Ị Gwara Anyị Gbasara Onwe Gị Eme na jw.org, anyị ga-edepụta ihe ahụ ka ndị nkwusa nwee ike ịmata ihe ọ bụla anyị dere gbasara ha na ihe anyị ga-eji ya eme. Biko, ị nọtụ, gaa ebe ahụ ka ị hụ ma à gbanweela ihe ọ bụla.