Gaa n'Isiokwu

Ihe E Ji Cookies na Ihe Ndị Ọzọ Yiri Ya Eme Ebe Niile n’Ịntanet

Ihe E Ji Cookies na Ihe Ndị Ọzọ Yiri Ya Eme Ebe Niile n’Ịntanet

Dị ka ọ na-adị ma ị gaa ọtụtụ ebe n’Ịntanet, ị bịa ebe a, e nwere ihe nwere ike isi na ya nọgide na fon gị, tablet gị, ma ọ bụkwanụ na kọmputa gị. Ihe ndị a ka ndị Bekee na-akpọ cookies ma ọ bụ web beacon, ma ọ bụkwanụ ihe ndị ọzọ yiri ha. E nwere ihe ndị ọzọ so na cookies anyị na-ekwu okwu ya ebe a. Otu n’ime ha bụ nke na-eme, ya dewe ebe ị gara, ya anọsie ike na kọmputa ma ọ bụ fon gị. A na-akpọ ya localStorage. Cookies na-enyere anyị aka ime ka ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet na-arụ ọrụ ọfụma ma na-eme ka anyị mara otú ndị mmadụ si aga ya. Otú o si eme ka anyị mara ihe ndị a na-enyere anyị aka ime ka ebe ndị anyị na-edebe ihe n’Ịntanet na-aka mma. Anyị anaghị eji ya achọ ịmata onye gara ebe ndị ahụ, ọ gwụkwala ma onye ahụ ò ji aka ya chọọ ịgwa anyị onye ọ bụ.

Cookies. E nwere ọtụtụ cookies na-arụ ụdị ọrụ dị iche iche, ma ha na-enye aka eme ka ịchọ ihe n’Ịntanet dịrị gị mfe. Ọ na-enyere anyị aka ịma ma ị̀ bịala ebe anyị na-edebe ihe mbụ, nakwa ihe ndị na-amasịkarị gị ma ị bịa. Dị ka ihe atụ, anyị nwere ike idebe asụsụ na-amasịkarị gị na cookies ka anyị nwee ike ịhọtara gị asụsụ ahụ ozugbo ị bịaghachiri. Anyị ejighị ya akpọsa ngwá ahịa.

Anyị nwere ike iji otu n’ime ụdị cookies ndị a kọwara n’okpuru ebe a mee ihe:

  1. Cookies Ndị Dị Ezigbo Mkpa. Cookies ndị a dị mkpa n’ihi na ha ga-enyere gị aka ime ihe ụfọdụ n’ebe a, dị ka ịbata ebe a na ịnọ na ya dejupụta ma zipụ fọm. Ma ọ́ bụghị cookies ndị a, ị gaghi enwe ike ime ihe ndị ị chọrọ ime, dị ka i si n’Ịntanet nye onyinye. Cookies ndị sokwa ná ndị a dị ezigbo mkpa bụ ndị nke na-eme ka e nwee ike imere gị kpọmkwem ihe ọ bụla ị chọrọ ka e meere gị mgbe ị na-achọ ihe n’Ịntanet. Cookies ndị a anaghị echekwa ihe ndị gbasara gị e nwere ike iji kpọsaa ngwá ahịa ma ọ bụ cheta ebe ndị ị garala n’Ịntanet.

  2. Cookies Ndị E Ji Echeta Ihe Ndị Ị Na-ahọrọkarị Ime. Cookies ndị a na-eme ka ebe ị gara n’Ịntanet nwee ike icheta ihe ndị ị na-ahọrọkarị ime (dị ka aha i ji abanye, asụsụ, ma ọ bụ ebe i si na-abanye) ma jiri ha mee ka ọ dịrị gị mfe ịna-abanye n’Ịntanet.

  3. Cookies Ndị Na-egosi Otú Ihe Si Aga. Cookie ndị a na-enye aka ịma mmadụ ole na-aga ebe a na-edebe ihe n’Ịntanet, ugboro ole a na-aga ya, ma ọ bụkwanụ ogologo oge onye gara n’Ịntanet na-anọ. Naanị ihe e ji ihe ndị a eme bụ iji mee ka ebe a a na-edebe ihe n’Ịntanet ka mma.

E nwere cookies ndị nke anyịnwa na-emepụta, nweekwa ndị nke ebe ndị ọzọ a na-aga achọ ihe n’Ịntanet na-emepụta. Ọ bụ naanị ndị nke anyị mepụtara ka anyị na-eji eme ihe, ọ gwụkwala ma ọ bụ ndị nke e nwetara na Google reCAPTCHA. E ji Google reCAPTCHA egosi ihe dị iche na mgbe mmadụ na-achọ ihe na mgbe kọmputa ji aka ya achọ ya. Ọ na-enye aka igbochi ozi iimel ndị a gwara kọmputa na ọ nọtụ ya ezipụ. Biko gụọ iwu Google gbasara isi n’aka ha achọ ihe n’Ịntanet na https://www.google.com/intl/en/policies/privacy/.

Web Beacons. E nwere otu obere ihe ọ bụ na-adị n’ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet na-enyere anyị aka ịmata ihe ụfọdụ, dị ka mgbe ị gara n’ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet. Ọ na-enyere anyị aka ịma otú e si aga n’ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet, marakwa ma ọ̀ na-arụkwa ọrụ ọfụma.

Ihe e ji IP Addresses. IP address bụ ọnụ ọgụgụ ndị e ji amata kọmputa gị n’Ịntanet. Anyị jikwa ya ama otú e si aga ebe anyị na-ede ihe n’Ịntanet, jirikwa ya achọpụta ihe bụ́ nsogbu e nwere, ka anyị nwee ike ime ka ọ dịrị gị mfe ịna-achọ ihe na ya na ịna-enweta ihe ị na-achọ. IP address gị anaghị agwa anyị kpọmkwem onye ị bụ, ọ gwụkwala ma ọ bụ gị ji aka gị denye ihe ụfọdụ gbasara onwe gị.

Ihe i kwetara. Ọ bụrụ na ị gaa n’ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet, cookies anyị na-aga nọrọ n’ihe i ji achọ ihe n’Ịntanet na kọmputa ma ọ bụ ekwentị gị. Ị gaa n’ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet, ọ pụtara na i kweere ka cookies anyị na ihe ndị ọzọ ha na ya yiri dịrị na kọmputa ma ọ bụkwanụ n’ekwentị gị. Ị chọọ iwepụ ha, i nwere ike ịga n’ihe iji achọ ihe n’Ịntanet mee otú ahụ. Ma, biko cheta na ime otú a ga-eme ka o nwee ihe ndị ị na-agaghị enwe ike ime ma ọ bụ nweta ma ị gaa n’ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet. Otú e si ewepụ cookies dịcha iche n’ihe dị iche iche e ji achọ ihe n’Ịntanet. I nwere ike ịga na Help menu nke ihe i ji achọ ihe n’Ịntanet ka o nyere gị aka ịma ihe ị ga-eme.