Gaa n'Isiokwu

Ihe Akwụkwọ Ndị Dị na Baịbụl Na-ekwu

Vidio ndị a na-akọwa ihe akwụkwọ ndị dị na Baịbụl na-ekwu. Ha ga-enyekwara gị aka ịmata ihe ndị ọzọ gbasara akwụkwọ Baịbụl nke ọ bụla. Jiri vidio ndị a na-amụ Baịbụl. Ha ga-enyere gị aka ịghọtakwu Baịbụl, ya ana-atọkwa gị ụtọ.

Ihe Akwụkwọ Jenesis Na-ekwu

Akwụkwọ Jenesis kọọrọ anyị ihe dị mkpa banyere otú ụmụ mmadụ si malite ịdị nakwa otú ụmụ mmadụ si malite ịta ahụhụ ma na-anwụ anwụ.

Ihe Akwụkwọ Ọpụpụ Na-ekwu

Chineke napụtara ụmụ Izrel n’ohu ha na-agba n’Ijipt, meekwa ka ha ghọọ mba na-efe ya.

Ihe Akwụkwọ Levitikọs Na-ekwu

Ị ga-ahụ otú akwụkwọ Levitikọs si kọwaa otú Chineke si dị nsọ nakwa ihe mere mmadụ ịdị nsọ ji dị ezigbo mkpa.

Ihe Akwụkwọ Ọnụ Ọgụgụ Na-ekwu

Ị ga-achọpụta otú irubere Jehova isi si baa uru na otú o si dị mkpa ka anyị na-akwanyere ndị o ji na-eduzi ndị ya ùgwù.

Ihe Akwụkwọ Diuterọnọmi Na-ekwu

Ị ga-ahụ otú Iwu Jehova nyere ụmụ Izrel si gosi na ọ hụrụ ha n’anya nke ukwuu.

Ihe Akwụkwọ Joshụa Na-ekwu

Lee vidio a ka ị hụ otú ndị Izrel si merie ndị bi n’ala Chineke nyere ha na otú ha si kee ya n’ebo n’ebo.

Ihe Akwụkwọ Ndị Ikpe Na-ekwu

Aha a kpọrọ akwụkwọ a bụ Ndị Ikpe n’ihi na ọ kọrọ gbasara ndị ikpe nwere obi ike na okwukwe, bụ́ ndị Chineke ji napụta ndị Izrel n’aka ndị na-emekpọ ha ọnụ.

Ihe Akwụkwọ Rut Na-ekwu

Akwụkwọ Rut kọrọ gbasara otú otu nwa agbọghọ di ya nwụrụ si gosi nne di ya di ya nwụkwara ezigbo ịhụnanya nakwa otú Jehova si kwụọ ha abụọ ụgwọ ọrụ.

Ihe Akwụkwọ 1 Samuel Na-ekwu

Ị ga-ahụ otú akụkọ ndị Izrel si si n’ihe mere n’oge Ndị Ikpe gafee n’ihe mere n’oge ndị eze chịwara ha.

Ihe Akwụkwọ 2 Samuel Na-ekwu

Gụọ akwụkwọ a ka ị hụ otú ịdị umeala n’obi Devid na okwukwe o nwere si mee ka ọ bụrụ otu n’ime ndị a kacha hụ n’anya na ndị a kacha anụ aha ha na Baịbụl.

Ihe Akwụkwọ 1 Ndị Eze Na-ekwu

Ị gụọ akwụkwọ a, ị ga-ahụ otú ihe si gaziere mba Izrel na otú mba a si baa ọgaranya n’oge Eze Solomọn na-achị. Ị ga-ahụkwa otú nsogbu si zuo ndị Izrel ahụ́ mgbe mba Izrel kewara bụrụzie alaeze Izrel na alaeze Juda.

Ihe Akwụkwọ 2 Ndị Eze Na-ekwu

Ị gụọ akwụkwọ a, ị ga-ahụ otú ikpere arụsị si mebiere alaeze Izrel nke dị n’ebe ugwu ọtụtụ ihe. Ma n’oge ahụ, Jehova gọziri mmadụ ole na ole ji obi ha niile na-efe ya.

Ihe Akwụkwọ 1 Ihe E Mere Na-ekwu

Ị ga-amata ezinụlọ Eze Devid, bụ́ onye tụrụ egwu Chineke, si na ya, matakwa ihe ndị mere ná ndụ ya, malite mgbe e mere ya eze Izrel ruo mgbe ọ nwụrụ.

Ihe Akwụkwọ 2 Ihe E Mere Na-ekwu

Ị ga-ahụ otú akụkọ a a kọrọ gbasara ndị eze chịrị Juda si gosi na irubere Chineke isi bara ezigbo uru.

Ihe Akwụkwọ Ezra Na-ekwu

Jehova mezuru nkwa o kwere ịnapụta ndị ya a dọọrọ n’agha laa Babịlọn na ime ka a maliteghachi ife ya na Jeruselem.

Ihe Akwụkwọ Nehemaya Na-ekwu

Akwụkwọ Nehemaya na-akụziri ndị na-efe Chineke taa ihe bara uru.

Ihe Akwụkwọ Esta Na-ekwu

Ihe ndị mere n’oge Esta ga-eme ka i nwee okwukwe siri ike na Jehova Chineke ga-anapụtali ndị ya ná nsogbu ndị na-abịara ha taa.

Ihe Akwụkwọ Job Na-ekwu

Ọnwụnwa ga-abịara ndị niile na-efe Jehova. Akụkọ Job na-eme ka obi sie anyị ike na anyị nwere ike ịnọgide na-efe Jehova, na-akwadokwa ọchịchị ya.

Ihe Akwụkwọ Abụ Ọma Na-ekwu

Akwụkwọ Abụ Ọma na-akwado ọchịchị Jehova, na-enyere ndị hụrụ ya n’anya aka ma na-akasi ha obi. Ọ na-egosikwa otú Alaeze Chineke ga-esi mee ka ụwa gbanwee.

Ihe Akwụkwọ Ilu Na-ekwu

Ị ga-ahụ ntụziaka si n’aka Chineke nke ga-enyere gị aka n’ihe ọ bụla ị na-eme ná ndụ, ma n’ihe gbasara azụmahịa ma n’ihe gbasara ezinụlọ.

Ihe Akwụkwọ Ekliziastis Na-ekwu

Eze Sọlọmọn kwuru gbasara ihe ndị dị ezigbo mkpa ná ndụ, na otú ha si dị iche n’ihe ndị Chineke kpọrọ asị.

Ihe Akwụkwọ Abụ Sọlọmọn Na-ekwu

Gịnị mere e ji sị na ịhụnanya nwa agbọghọ Shunem na onye ọzụzụ atụrụ ahụ bụ “ire ọkụ nke Jaa”?

Ihe Akwụkwọ Aịzaya Na-ekwu

Aịzaya buru amụma ndị mezurunụ. Otú ha si mezuo na-eme ka obi sie anyị na Jehova na-emezu nkwa ya nakwa na ọ na-azọpụta ndị ya.

Ihe Akwụkwọ Jeremaya Na-ekwu

Jeremaya nọsiri ike na-eje ozi ya n’agbanyeghị mkpagbu. Chee ihe Ndị Kraịst ga-amụta n’aka ya taa.

Ihe Akwụkwọ Abụ Ákwá Na-ekwu

Ọ bụ Jeremaya dere akwụkwọ Abụ Ákwá. O dere otú mbibi e bibiri Jeruselem si wute ya, kwuokwa na ọ bụrụ na ha echegharịa na Jehova ga-agbaghara ha.

Ihe Akwụkwọ Ezikiel Na-ekwu

Ezikiel dị umeala n’obi. Ọ katara obi mee ihe ọ bụla Jehova gwara ya mee, n’agbanyeghị otú o siruru n’ike. Anyị nwere ike ịmụta ihe bara ezigbo uru n’ihe a o mere.

Ihe Akwụkwọ Daniel Na-ekwu

Daniel na ndị enyi ya rubeere Jehova isi n’agbanyeghị ọnwụnwa ndị bịaara ha. Ihe a ha mere na otú amụma Daniel si mezuo ga-abara anyị uru n’oge ikpeazụ a.

Ihe Akwụkwọ Hosia Na-ekwu

Amụma Hosia na-akụziri anyị ezigbo ihe gbasara otú Jehova si emere ndị mmehie chegharịrịnụ ebere, nakwa otú ọ chọrọ ka e si na-efe ya.

Ihe Akwụkwọ Joel Na-ekwu

Joel buru amụma gbasara “ụbọchị Jehova” na-abịanụ na ihe mmadụ ga-eme iji dị ndụ. Amụma ya dị ezigbo mkpa taa.

Ihe Akwụkwọ Emọs Na-ekwu

Jehova ji nwoke a dị umeala n’obi rụọ ọrụ dị ezigbo mkpa. Olee ihe bara ezigbo uru anyị ga-amụta n’ihe Emọs mere?

Ihe akwụkwọ Obedaya na-ekwu

Ọ bụ akwụkwọ Obedaya kacha obere n’akwụkwọ ndị e nwere n’Akwụkwọ Nsọ Hibru ma ọ bụ n’Agba Ochie. Amụma ya na-eme ka e nwee olileanya. O kwekwara nkwa na ọchịchị Jehova agaghị enwe ihe ọ bụla a ga-eji taa ya ụta.

Ihe Akwụkwọ Jona Na-ekwu

Jona onye amụma nabatara aka ná ntị Jehova dọrọ ya ma jee ozi o dunyere ya. Jehova kụzikwaara ya na ọ hụrụ ndị mmadụ n’anya ma na-emere ha ebere. Akụkọ gbasara Jona ga-eru gị n’obi.

Ihe Akwụkwọ Maịka Na-ekwu

Amụma a e ji ike mmụọ nsọ Chineke buo ga-eme ka obi sie anyị ike na ihe Jehova chọrọ ka anyị mee bụ naanị ihe anyị ga-emeli nakwa ihe ga-abara anyị uru.

Ihe Akwụkwọ Nehọm Na-ekwu

Amụma Nehọm na-eme ka obi sie anyị ike na Jehova na-emezu ihe ọ bụla o kwuru mgbe niile nakwa na ọ na-akasi ndị chọrọ ka Alaeze ya bịa weta udo ma zọpụta ha obi.

Ihe Akwụkwọ Habakọk Na-ekwu

Obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova ma mgbe niile oge kacha mma na otú kacha mma ọ ga-esi zọpụta ndị nke ya.

Ihe Akwụkwọ Zefanaya Na-ekwu

Gịnị mere anyị ji kwesị ịkpachara anya ka anyị ghara iche na ụbọchị Jehova ga-ekpe ndị ọjọọ ikpe agaghị abịa?

Ihe Akwụkwọ Hagaị Na-ekwu

Amụma a gosiri na ọ dị mkpa mmadụ iji ife Chineke kpọrọ ihe karịa mmadụ ịna-achọ ihe nke aka ya.

Ihe Akwụkwọ Zekaraya Na-ekwu

E nwere ọtụtụ ọhụụ na amụma ndị gbara ndị Chineke ume n’oge ochie. Ha ka na-eme ka obi sie anyị ike na Jehova kwụ anyị n’azụ taa.

Ihe Akwụkwọ Malakaị Na-ekwu

Ihe dị n’akwụkwọ Malakaị bụ amụma ndị na-egosi na Jehova na-eme ebere, hụ anyị n’anya, nakwa na ụkpụrụ ya anaghị agbanwe agbanwe. Amụma a na-akụzikwara anyị ihe bara uru maka ihe ndị na-eme n’oge a.

Ihe Akwụkwọ Matiu Na-ekwu

Mụta ihe ụfọdụ gbasara akwụkwọ Matiu, nke bụ́ akwụkwọ mbụ n’ime akwụkwọ Baịbụl anọ kọrọ banyere ihe ndị Jizọs mere n’ụwa.

Ihe Akwụkwọ Mak Na-ekwu

N’akwụkwọ Baịbụl anọ ahụ kọrọ banyere ozi Jizọs, akwụkwọ Mak kacha obere. Ihe ọ kọrọ gosiri ihe Jizọs ga-eme mgbe ọ ga-achịwa n’Alaeze Chineke.

Ihe Akwụkwọ Luk Na-ekwu

Olee ụfọdụ ihe ọ bụ naanị n’akwụkwọ Luk ka e dere ha?

Ihe Akwụkwọ Jọn Na-ekwu

Akwụkwọ Jọn gosiri na Jizọs hụrụ ụmụ mmadụ n’anya, dị umeala n’obi, nakwa na ọ bụ Mezaya, bụrụkwa Eze nke Alaeze Chineke.

Ihe Akwụkwọ Ọrụ Ndịozi Na-ekwu

Ndị Kraịst oge mbụ gbasiri mbọ ike iji mee ka ndị si ná mba dị iche iche ghọọ ndị na-eso ụzọ Jizọs. Akwụkwọ Ọrụ Ndịozi nwere ike ime ka i jirikwuo ịnụ ọkụ n’obi na obi ụtọ na-ekwusa ozi ọma.

Ihe Akwụkwọ Ndị Rom Na-ekwu

E ji ike mmụọ nsọ dee akwụkwọ a gosiri na Jehova anaghị ele mmadụ anya n’ihu nakwa na inwe okwukwe na Jizọs Kraịst dị ezigbo mkpa.

Ihe Akwụkwọ Ndị Kọrịnt nke Mbụ Na-ekwu

Ihe ụfọdụ Pọl dere bụ ka Ndị Kraịst na-adị n’otu, ka ha gbaara ịkwa iko ọsọ, ka ha nwee ezigbo ịhụnanya, ma kwere ná mbilite n’ọnwụ.

Ihe Akwụkwọ Ndị Kọrịnt nke Abụọ Na-ekwu

Jehova, bụ́ “Chineke nke nkasi obi niile,” na-enye ndị na-efe ya ike, na-akwadokwa ha.

Ihe Akwụkwọ Ndị Galeshia Na-ekwu

Akwụkwọ ozi Pọl degaara ndị Galeshia ka bara uru taa otú ahụ ọ bara mgbe ahụ o dere ya. Akwụkwọ a ga-enyere ezigbo Ndị Kraịst niile aka ịnọgide na-eme uche Chineke.

Ihe Akwụkwọ Ndị Efesọs Na-ekwu

Akwụkwọ a e si n’ike mmụọ nsọ dee gosiri na ọ bụ nzube Chineke isi n’aka Jizọs Kraịst mee ka e nwee udo na ịdị n’otu.

Ihe Akwụkwọ Ndị Filipaị Na-ekwu

Ọ bụrụ na anyị atachie obi mgbe a na-emegide anyị, o nwere ike ime ka ndị ọzọ gụzosie ike n’okwukwe ma e megidewe ha.

Ihe Akwụkwọ Ndị Kọlọsi Na-ekwu

Anyị nwere ike ime Jehova obi ụtọ ma anyị na-etinye ihe ndị anyị mụtara na Baịbụl n’ọrụ, ma anyị na-agbaghara ndị mejọrọ anyị, nakwa ma anyị nabata ọkwá na ikike e nyere Jizọs.

Ihe Akwụkwọ Ndị Tesalonaịka nke Mbụ Na-ekwu

Anyị kwesịrị ịmụrụ anya, ‘na-achọpụta ihe niile,’ na-ekpe ekpere n’akwụsịghị akwụsị, ma na-agbarịta ibe anyị ume.

Ihe Akwụkwọ Ndị Tesalonaịka nke Abụọ Na-ekwu

Pọl gbaziri echiche na-ezighị ezi e nwere banyere ụbọchị Jehova, gbaakwa ụmụnna ya ume ka ha nọsie ike n’okwukwe.

Ihe Akwụkwọ Timoti nke Mbụ Na-ekwu

Pọl onyeozi dere akwụkwọ Timoti nke mbụ iji kọwaa otú ihe ga-esi na-aga n’ọgbakọ na iji dọọ Ndị Kraịst aka ná ntị ka ha kpachara anya maka ndị na-ezi ozizi ụgha nakwa ka ha ghara ịhụ ego n’anya.

Ihe Akwụkwọ Timoti nke Abụọ Na-ekwu

Pọl gbara Timoti ume ka o jezuo ozi ya.

Ihe Akwụkwọ Taịtọs Na-ekwu

Akwụkwọ ozi a Pọl degaara Taịtọs kwuru gbasara nsogbu ndị e nwere n’ọgbakọ ndị dị na Krit, kwuokwa ihe ndị a ga-eji ama na nwanna nwoke ruru eru ịbụ okenye n’ọgbakọ.

Ihe Akwụkwọ Faịlimọn Na-ekwu

Obere akwụkwọ ozi a nwere ọtụtụ ihe anyị ga-amụta na ya, dị ka ịna-adị umeala n’obi, ịna-enwe obiọma, na ịna-agbaghara ndị ọzọ.

Ihe Akwụkwọ Ndị Hibru Na-ekwu

O nwere ihe ndị karịrị ụlọ nsọ nkịtị na àjà ndị e ji ụmụ anụmanụ achụ ofufe Ndị Kraịst dabeere na ha.

Ihe Akwụkwọ Jems Na-ekwu

Jems ji ihe atụ ndị doro anya kụzie otú Ndị Kraịst ga-esi na-ebi ndụ.

Ihe Akwụkwọ Pita nke Mbụ Na-ekwu

Akwụkwọ ozi mbụ Pita dere gbara anyị ume ka anyị guzosie ike n’okwukwe ma tụkwasị Chineke nchegbu anyị niile.

Ihe Akwụkwọ Pita nke Abụọ Na-ekwu

Pita nke abụọ gbara anyị ume ka anyị nọgide na-efe Chineke ka anyị na-echere eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ.

Ihe Akwụkwọ Jọn nke Mbụ Na-ekwu

Akwụkwọ ozi Jọn dọrọ anyị aka ná ntị banyere ndị na-emegide Kraịst. Ọ na-enyekwara anyị aka ịma ihe anyị ga-ahụ n’anya na ihe anyị na-agaghị ahụ n’anya.

Ihe Akwụkwọ Jọn nke Abụọ Na-ekwu

Akwụkwọ ozi nke abụọ a Jọn dere na-echetara anyị ka anyị nọgide na-eje ije dị ka ihe ndị Chineke nyere n’iwu si dị nakwa ka anyị ghara ikwe ka ndị nduhie ghọgbuo anyị.

Ihe Akwụkwọ Jọn nke Atọ Na-ekwu

Akwụkwọ Jọn nke Atọ kụziri ihe bara uru nke bụ́ ka Ndị Kraịst na-ele ọbịa.

Ihe Akwụkwọ Jud Na-ekwu

Jud kọwara ụzọ aghụghọ ndị na-achọ iduhie Ndị Kraịst na ndị na-achọkwa imerụ àgwà ha na-esi eme ya.

Ihe Akwụkwọ Mkpughe Na-ekwu

Ọhụụ ndị dị ịtụnanya dị n’akwụkwọ Mkpughe na-egosi otú Alaeze Chineke ga-esi mee ka nzube Chineke maka ụmụ mmadụ na ụwa mezuo.

Isiokwu A Nwekwara Ike Ịmasị Gị