Gaa n'Isiokwu

IHE NDỊ GA-ENYERE EZINỤLỌ AKA | ỊZỤ ỤMỤ

Ihe Ndị Nne na Nna Kwesịrị Ịma Gbasara Ebe Ndị A Na-elekọta Ụmụaka

Ihe Ndị Nne na Nna Kwesịrị Ịma Gbasara Ebe Ndị A Na-elekọta Ụmụaka

 Ụfọdụ ndị nne na nna gawa ọrụ, ha na-akpọga ụmụ ha na-erubeghị ịga ụlọ akwụkwọ ebe a na-elekọta ụmụaka. Otú e si elekọta ụmụaka ebe ahụ yikwara otú e si elekọta ha n’ụlọ akwụkwọ. Ì kwesịrị ịkpọga nwa gị ụdị ebe ahụ?

 Ajụjụ ndị i kwesịrị ịjụ onwe gị

 M kpọga nwa m ebe a na-elekọta ụmụaka, ọ̀ ga-akpa adịm ná mma mụ na ya aka? O nwere ike. Ụbụrụ ụmụaka na-echeta ihe otú na-enweghị atụ, na-enyekwara ha aka ịmara onye ha ga na-abịa nso na onye ha ga na-agbara ọsọ. N’ihi ya, gbaa mbọ wepụta oge ka gị na nwa gị na-anọ mgbe ọ ka dị obere.—Diuterọnọmi 6:6, 7.

  •    Ndị nne na nna kpebiwe ma hà ga na-akpọga ụmụ ha ebe a na-elekọta ụmụaka, ha kwesịrị ileba anya n’ihe ha ga na-eme ka ha na ha ka dịrị ná mma.

 Ọ̀ ga-eme ka nwa m ghara ịna-ege m ntị? O nwere ike. Otu akwụkwọ aha ya bụ Hold On to Your Kids kwuru na “ọ bụrụ na ụmụaka na-erubeghị ịga akwụkwọ na ibe ha na-anọkarị, ha ga na-amụta ịna-eme ka ibe ha.”

  •   Ndị nne na nna chọọ ịkpọga nwa ha ebe a na-elekọta ụmụaka, ha kwesịrị ịchọpụta ma ọ̀ ka ga na-ege ha ntị ma ha kpọga ya ebe ahụ, ka ọ̀ ga-egewezi ụmụaka ibe ya ntị.

 Ịkpọga nwa m ụdị ebe ahụ ọ̀ ga-eme ka ụbụrụ na-aghọ ya nkọ mgbe ọ ga-emecha gawa akwụkwọ? Ụfọdụ ndị chere na ọ ga-eme. Ma, e nwekwara ndị chere na e nweghị ihe gbasara ịkpọga nwatakịrị ụdị ebe ahụ na ụbụrụ ịghọ ya nkọ n’ụlọ akwụkwọ. Nke ọ sọrọ ya bụrụ, otu onye mụrụ gbasara otú ụmụaka si akpa àgwà aha ya bụ Penelope Leach kwuru, sị: “Echela na ọ bụ ‘ịgụ akwụkwọ’ ga-eme ka mmadụ baa uru ná ndụ. Echekwala na ọ kacha mma ka nwatakịrị bido n’ezigbo oge gụwa akwụkwọ. I chee otú ahụ, ọ pụtara na ị maghị uru ‘ihe ị na-akụziri’ nwa gị kemgbe ị mụrụ ya.”

  •   Tupu ndị nne na nna akpọga nwa ha ụdị ebe ahụ, ha kwesịrị ịchọpụta ma ò nwere uru ọ ga-abara ha.

 Di na nwunye, ùnu nwere ike ikpebi ka otu onye n’ime unu nọrọ n’ụlọ na-elekọta nwa unu kama unu abụọ ịna-aga ọrụ? Mgbe ụfọdụ, ihe na-eme ka nne na nna na-arụ ọrụ bụ naanị ka ha na-enweta nnukwu ego. Ma, ọ̀ bụ ya bụ ihe kacha mma ha kwesịrị ime?

  •   Tupu ndị nne na nna akpọga nwa ha ebe a na-elekọta ụmụaka, ha kwesịrị ile ma hà nwere ike ibelata ego ha na-emefu, ka otu onye n’ime ha nwee ike ịnọ n’ụlọ na-elekọta nwa ha.

 Buru ụzọ chebara uru na ọghọm dị n’ịkpọga nwa gị ebe a na-elekọta ụmụaka echiche tupu gị amara ma ọ̀ bụ ihe ị ga-eme. Olee ihe i nwere ike ime ma i chechaa ya ma kpebie na ọ ga-akara gị mma ịkpọga nwa gị ụdị ebe ahụ?

 Ihe i nwere ike ime

 Baịbụl kwuru na “onye ma ihe na-echebara ihe ọ bụla ọ chọrọ ime echiche.” (Ilu 14:15) N’ihi ihe a Baịbụl kwuru, chee ya nke ọma tupu gị ekpebie otú kaara gị mma ka e si na-elekọta nwa gị.

 Chọpụta otú kaara gị mma ka e si na-elekọta ụmụ gị

  •   Ụfọdụ ndị nne na nna na-akpọga ụmụ ha n’ụlọ mmadụ ka a na-elekọta ha ebe ahụ. N’ụdị ebe a, ụmụaka a na-elekọta anaghị adị ọtụtụ, ọ na-abụkwa otu onye ma ọ bụ mmadụ ole na ole na-elekọta ha.

  •   E nwekwara ndị nne na nna na-aga kpọrọ onye ikwu ha, ha na ya ebiri, ya ana-elekọtara ha nwa ha.

 Nke ọ bụla ị họọrọ nwere uru na ọghọm. I nwere ike ịjụ ụfọdụ ndị nne na nna merela ihe ndị a nke ha chere ka mma. Baịbụl kwuru, sị: “Ndị na-achọ ka a dụọ ha ọdụ ma ihe.”—Ilu 13:10.

 Gịnịkwanụ ka i nwere ike ime ma ọ bụrụ na ebe kaara gị mma ịkpọga ụmụ gị bụ ebe a na-elekọta ụmụaka? Ọ bụrụ otú ahụ . . .

 Jụọ ajụjụ gbasara ebe ahụ

  •   Gọọmentị ò nyere ha ikike ịna-elekọta ụmụaka? Ha na-eso iwu obodo n’ihe ndị ha na-eme? Ndị mmadụ ọ̀ tụkwasịrị ha obi ma na-ekwu okwu ọma gbasara ha?

  •   À na-edowe ebe ahụ ọcha? Ọ̀ kwa o nweghị ihe na-eme ụmụaka nọ ebe ahụ?

  •   Olee ihe ndị nwa gị ga na-eme ebe ahụ? a

 Jụọ ajụjụ gbasara ndị na-arụ ọrụ ebe ahụ

  •   Hà ma ọrụ ha nke ọma? Dị ka ihe atụ, hà ma otú e si akụziri obere ụmụka ihe? Hà ma ọgwụ e nwere ike inye mmadụ ma ọ bụ ihe e nwere ike ime ma ihe ọghọm mee tupu a gawa ụlọ ọgwụ?

  •   Ì mere nchọnchọ ka ị mara ma hà bụ ndị omekome?

  •   Ọ̀ na-abụ ndị rụọ taa, echi ị gaghịzi ahụ ha? Ọ bụrụ otú ahụ, ọ pụtara na ihe nwa gị ga na-arụ mgbe niile bụ ịmata ihu ndị dị iche iche na-elekọta ya.

  •   Ụmụaka ole ka otu onye na-elekọta? Ọ bụrụ na otu onye na-elekọta ọtụtụ ụmụaka, ọ pụtara na a gaghị na-elebara nwa gị anya otú o kwesịrị. Ị manụ na ọ bụ afọ ole nwa gị dị na otú o si eme ka a ga-eji ama otú a ga-elebaruru ya anya.

  •   Hà na-ewepụta ohere ka gị na ha kwurịta okwu ma e nwee ihe ị chọrọ ịgwa ha ma ọ bụkwanụ ma hanwa nwee ihe ha chọrọ ịgwa gị?

a Dị ka ihe atụ, ọ̀ ga-eji nnukwu oge na-ele tiivii, ka è nwere ihe ndị ọzọ a na-eme ebe ahụ, ndị ga-eme ka nwa gị na-amụta ihe, ahụ́ esiekwa ya ike?