Gaa n'Isiokwu

AMAOKWU BAỊBỤL NDỊ A KỌWARA

Ndị Galeshia 6:9—“Ka Ike Ghara Ịgwụ Anyị n’Ime Ihe Ọma”

Ndị Galeshia 6:9—“Ka Ike Ghara Ịgwụ Anyị n’Ime Ihe Ọma”

 “Ka ike ime ihe dị mma ghara ịgwụ anyị, n’ihi na mgbe oge ruru, anyị ga-aghọrọ mkpụrụ ya ma ọ bụrụ na ike agwụghị anyị.”​—Ndị Galeshia 6:9, Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ.

 “Ka ike ghara ịgwụ anyị n’ime iheọma, n’ihina mgbe oge ruru, anyị ga-aghọta mkpụrụ ọma, ma ọ bụrụ na anyị adaghị m̀bà.”​—Ndị Galeshia 6:9, Baịbụl Nsọ: Nhazi Katọlik.

Ihe Ndị Galeshia 6:9 Pụtara

 Pọl onye ozi gbara Ndị Kraịst ume ka ha nọgide na-eme ihe ọma ma ọ bụ ihe dị Chineke mma. Ọ bụrụ na ha ana-eme otú ahụ, obi ga-esi ha ike na Chineke ga-akwụ ha ụgwọ.

 “Ka ike ime ihe dị mma ghara ịgwụ anyị.” Otú ọzọ e nwere ike isi kwuo ya bụ “ka ike ghara ịgwụ anyị n’ime ihe ọma.” Okwu Grik e si sụgharịta ya nwekwara ike ịpụta ka mmadụ ghara ịda mbà ma ọ bụ ghara ịkwụsị ịnụ ọkụ n’obi. Ebe ọ bụ na Pọl onyeozi kwuru “anyị,” o gosiri na okwu a gbasakwara ya maka na e nwere oge ndị yanwa dakwara mbà.​—Ndị Rom 7:21-24.

 “Ihe dị mma,” ma ọ bụ ihe ọma, bụ ihe niile Onye Kraịst ọ bula kwesịrị ịna-eme n’ofufe Jehova. Ihe ndị so na ha bụ ihe niile mmadụ na-eme iji nyere ndị kwere ekwe ibe ya nakwa ndị ọzọ aka.​—Ndị Galeshia 6:10.

 “Mgbe oge ruru, anyị ga-aghọrọ mkpụrụ ya ma ọ bụrụ na ike agwụghị anyị.” Pọl chetaara ndị o degaara akwụkwọ ozi ahụ na o nwere ike iwe oge tupu ha ahụ uru ihe ọma ha na-eme bara, otú ahụ ihe onye ọrụ ubi kọrọ na-ewe oge tupu ya etoo. Ihe Pọl kwuru banyere ịghọrọ mkpụrụ n’amaokwu nke 9 dabara n’eziokwu doro anya dị n’amaokwu nke 7, ebe sịrị na “mkpụrụ ọ bụla mmadụ na-agha ka ọ ga-aghọrọ.” Ihe ọ pụtara bụ na ọ bụrụ na Onye Kraịst ana-eme ihe dị mma n’anya Chineke, Chineke ga-akwụ ya ezigbo ụgwọ, ndụ ebighị ebi sokwa na ya.​—Ndị Rom 2:6, 7; Ndị Galeshia 6:8.

Ihe Ndị Gbara Ndị Galeshia 6:9 Gburugburu

 Ọ bụ n’ihe dị ka agbata afọ 50 ruo 52 O.N.K ka Pọl onyeozi degaara Ndị Kraịst nọ na Galeshia akwụkwọ ozi a. O dere ya ka ndị na-asị na ha bụ Ndị Kraịst ma na-akụzi ihe na-abụghị eziokwu ghara inweta Ndị Kraịst. (Ndị Galeshia 1:6, 7) Ndị nkụzi ụgha a nọ na-arụ ụka na Ndị Kraịst kwesịrị ịna-edebe Iwu Chineke si n’aka Mosis nye ndị Izrel oge ochie. (Ndị Galeshia 2:15, 16) Pọl mere ka o doo anya na Iwu ahụ arụọla ihe o kwesịrị ịrụ nakwa na Chineke achọghịzi ka ndị na-efe ya na-edebe ya.​—Ndị Rom 10:4; Ndị Galeshia 3:23-25.

 Mgbe Pọl gwara Ndị Kraịst ibe ya ka ha “na-eme ihe dị mma,” ihe ọ na-ekwu abụghị ka ha na-edebe Iwu Mosis. Kama, ọ na agba ha ume ka ha “na-erubere iwu Kraist isi.” Ihe so n’iwu ahụ bụ ihe niile Jizọs kụziri banyere imere ndị ọzọ ihe ọma.​—Ndị Galeshia 6:2; Matiu 7:12; Jọn 13:34.

 Lee obere vidio a ka ị hụ ihe akwụkwọ Ndị Galeshia na-ekwu.